7 Site kwa n'umu Ilam, Jeshaia nwa Atalaia; ndi soro ya di ọgu ndikom atọ na iri.
7 Ndị sitere nʼikwu Elam, Jeshaya nwa Atalaya, na iri ndị ikom asaa (70),
Shekania nwa Jehiel, nke sitere n'umu Ilam, we za, si Ezra, Ayi onwe-ayi emekpuwo emekpu megide Chineke-ayi, luta ndinyom ala ọzọ sitere na ndi di iche iche nke ala nka: ma ub͕u a Israel nwere olile-anya bayere ihe a.
Umu Ilam nke-ọzọ, nnù atọ na ọgu abua na iri na anọ.
Umu Ilam, nnù atọ na ọgu abua na iri na anọ.
Site kwa n'umu Adin, Ebed nwa Jonatan; ndi soro ya di ọgu ndikom abua na iri.
Site kwa n'umu Shefataia, Zebadaia nwa Maikael; ndi soro ya di ọgu ndikom anọ.