2 Site n'umu Finehas, Giashom: site n'umu Itama, Daniel: site n'umu Devid, Hatush.
2 ndị ikwu Finehaz, Geshọm; ndị ikwu Itama, Daniel; ndị ikwu Devid, Hatush
Ma ndia bu umu-ndikom Devid, ndi amuru nye ya nime Hebron: ọkpara-ya, bú Amnon, nwa Ahinoam nwayi Jezreel; nke-abua, Daniel, nwa Abigail nwayi Kamel;
Umu-ndikom Shekanaia kwa; Shemaia: umu-ndikom Shemaia kwa: Hatush, na Igal, na Baria, na Nearaia, na Shefat, isi.
Ma ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha, nka bu kwa akwukwọ-osuso-ọmumu nke ndi nēsom si na Babilon rigo, n'ọbubu-eze Ataksakses, bú eze.
M'we chikọta ha rue osimiri nke nērùbata n'Ahava; ayi we nọ n'ọmuma-ulo-ikwū n'ebe ahu ubọchi atọ: m'we mata ndi ahu, mata kwa ndi-nchu-àjà, ma ọ dighi onye nime umu Livai m'chọtara n'ebe ahu.