Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ezra 8:18 - Bible Nso

18 Ha we me ka otù nwoke nke nwere uche biakute ayi, dika ezi aka nke Chineke-ayi si di n'aru ayi, o sitere n'umu Mahli, nwa Livai, nwa Israel; na Sherebia na umu-ya ndikom na umu-nne-ya, iri-na-asatọ;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Chineke gosikwara anyị obiọma zitere anyị nwoke a na-akpọ Sherebaya na ụmụ ya, na ụmụnne ya, ndị ọnụọgụgụ ha dị iri na asatọ (18). Sherebaya bụ nwa Mahali, nwa Livayị nwa Izrel, bụrụkwa nwoke nwere ezi uche.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ezra 8:18
22 Iomraidhean Croise  

Umu-ndikom Livai; Giashon, na Kohat, na Merari.


Umu-ndikom Merari; Mahli na Mushi. Ndia bu ab͕uru Livai dika ulo nke ndi bu nna-ha si di.


Eleeza muru Finehas, Finehas muru Abishua;


Hezekaia we gwa ndi Livai nile okwu nābà ha n'obi, bú ndi nwere ezi uche bayere Jehova. Ha we rie ihe ahu akara àkà ubọchi asa ahu, nāchu àjà, bú àjà-udo, nēkele kwa Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha.


Onye setiwo-kwa-ra ebere-Ya n'ebe m'nọ n'iru eze na ndi nādu ya ọdu, na n'iru ndi-isi nile nke eze bu ndi-dike. M'we me onwem ka m'di ike dika aka Jehova, bú Chinekem, si di n'arum, m'we chikọputa n'Israel ndi-isi isorom rigo.


Ezra nka siri na Babilon rigo; ma onye ahu bu ode-akwukwọ nke bu onye-ọ̀kà n'iwu Moses, nke Jehova, bú Chineke Israel, nyere: eze we nye ya ihe nile ọ riọrọ, dika aka Jehova, bú Chineke-ya, si di n'aru ya.


N'ihi na n'ubọchi mbu nke ọnwa mbu, nke ahu bu ntọ-ala nke nrigo ahu site na Babilon, ma ọ bu n'ubọchi mbu nke ọnwa nke-ise ka ọ biaruru Jerusalem, dika ezi aka Chineke-ya si di n'aru ya.


M'we zìe kpọ Elieza, kpọ kwa Ariel, kpọ kwa Shemaia, kpọ kwa Elnetan, kpọ kwa Jarib, kpọ kwa Elnetan, kpọ kwa Netan, kpọ kwa Zekaraia, kpọ kwa Meshulam, bú ndi-isi; m'kpọ kwa Joiarib, kpọ kwa Elnetan, bú ndi-nghọta.


na Hashabaia, ya na Jeshaia nke sitere n'umu Merari, na umu-nne-ya na umu-ha ndikom, orú madu;


N'ihi na emerem ihere iriọ n'aka eze usu-ndi-agha na ndi-inyinya iyere ayi aka n'ihi onye-iro nke di n'uzọ: n'ihi na ayi gwara eze okwu, si, Aka Chineke-ayi di n'aru ndi nile nāchọ Ya, ime ha nma; ma ike-Ya na iwe-Ya nēmegide ndi nile nārapu Ya.


M'we kewaputa na ndi-isi nke ndi-nchu-àjà madu iri na abua, bú Sherebia na Hashabaia, ha na madu iri ndi sitere n'umu-nne-ha,


na Zakua, na Sherebia, na Shebania;


Ndi-isi ndi Livai kwa: Hashabaia, na Sherebia, na Jeshua nwa Kadimiel, na umu-nne-ha ndi nọ na ncherita-iru ha, ito Chineke na ikele ekele, dika ihe Devid, bú onye nke Chineke, nyere n'iwu si di, otù ihe-ndebe nēcherita ihe-ndebe ọzọ iru.


na akwukwọ-ozi inye Esaf, bú onye nēche ogige ọma nke eze nwere, ka ọ nyem osisi ijikọta ọnu-uzọ-ama nile nke ulo uku ahu n'otù nke diri ulo ahu, na ijikọta mb͕idi obodo n'otù, na ijikọta ulo n'otù, bú nke m'gābà nime ya. Eze we nyem, dika ezi aka Chinekem si di n'arum.


Ọzọ, Jeshua, na Bani, na Sherebia, na Jamin, na Akub, na Shabetai, na Hodia, na Maaseia, na Kelita, na Azaraia, na Jozabad, na Hanan, na Pelaia, na ndi Livai, mere ka ndi ahu ghọta iwu ahu: ndi ahu nēguzo kwa n'ebe-nguzo-ha.


Amam-ihe ka eji ewu ulo; Ọ bu kwa nghọta ka eji eme ka o guzosie ike:


N'uzọ-gi nile mara Ya, Ya onwe-ya gēme kwa ka okporo-uzọ-gi nile zie ezi.


M'gēnye kwa unu ndi-ọzùzù-aturu dika obim si di, ndi gēji ihe-ọmuma na inwe-uche azù unu.


Ma n'okwu ọ bula nke amam-ihe nke nghọta, nke eze chọrọ n'aka ha, ọ huru na ha ka ndi-ode-akwukwọ di nsọ nile na ndi-dibia nile ndi nọ n'ala-eze-ya nile nma ub͕ò iri.


Umu-ndikom Merari kwa dika ab͕uru nile ha si di; Mahli na Mushi. Ndia bu ab͕uru ndi Livai, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di.


Umu-nnam, unu abula umu-ntakiri n'uche-unu: kama burunu umu ọhu n'obi ọjọ, ma n'uche-unu burunu ndi tozuru okè.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan