Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ezra 8:17 - Bible Nso

17 M'we nye ha iwu inye Ido, bú onye-isi na Kasifia, bú ebe ahu; m'we tiye n'ọnu-ha okwu igwa Ido, bú nwa-nne-ya, na Netinim, nime Kasifia, bú ebe ahu, ka ha me ka ndi nējere ulo Chineke-ayi ozi biakute ayi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 Enyere m ha iwu ka ha gakwuru Ido, onyendu nọ na Kasifia. Agwara m ha ihe ha ga-agwa Ido na ndị Livayị ibe ya, bụ ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ dị na Kasifia, ka ha zite ndị ga-eje ozi ka ha bịakwute anyị maka ụlọnsọ Chineke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ezra 8:17
16 Iomraidhean Croise  

Eze we si, Àka Joab diyere gi n'ihe a nile? Nwayi ahu we za, si, Ndu nke nkpuru-obi-gi, onye-nwem, bú eze, ọ dighi onye ọ bula nēsi n'ihe ọ bula onye nwem, bú eze, kwuru, che iru n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe: n'ihi na orù-gi, bú Joab, ya onwe-ya nyerem iwu, ya onwe-ya tiye-kwa-ra okwu ndia nile n'ọnu nwayi nējere gi ozi:


i gābakuru kwa eze, gwa ya okwu dika okwu a si di. Joab we tiye okwu n'ọnu-ya.


Ma ndi-obibi mbu ndi bi n'ihe-onwunwe-ha n'obodo nile ha bu, Israel, ndi-nchu-aja, ndi Livai, na Netinim.


Netinim: umu Ziha, na umu Hasufa, na umu Tabaot;


Netinim nile, na umu ndi-orù Solomon, di ọgu iri-na-iteghete na iri na abua.


Ufọdu nime umu Israel na nime ndi-nchu-àjà na ndi Livai na ndi-ọbù-abù na ndi-ọnu-uzọ-ama na Netinim we rigorue Jerusalem n'arọ nke-asa nke Ataksakses, bú eze.


M'we zìe kpọ Elieza, kpọ kwa Ariel, kpọ kwa Shemaia, kpọ kwa Elnetan, kpọ kwa Jarib, kpọ kwa Elnetan, kpọ kwa Netan, kpọ kwa Zekaraia, kpọ kwa Meshulam, bú ndi-isi; m'kpọ kwa Joiarib, kpọ kwa Elnetan, bú ndi-nghọta.


I gāgwa kwa ya okwu, tiye okwu ndia n'ọnu-ya: Mu onwem gānọye-kwa-ra ọnu-gi, nọye-kwa-ra ọnu-ya, zí kwa unu ihe ahu unu gēme.


Jehova we setipu aka-Ya, me ka o rutu ọnum: Jehova we sim, Le, etinyewom okwum nile n'ọnu-gi:


N'ihi nka ka Jehova ji si otú a, Ọ buru na i lata, M'gēme kwa ka i lata, n'irum ka i gēguzo; ọ buru na i me ka ihe di oké ọnu-ahia si n'ihe jọb͕uru onwe-ya puta, dika ọnum ka i gābu: ndi ahu gālaghachikute gi, ma gi onwe-gi agaghi-alaghachikute ha.


Ma Mu onwem, le, esiwom n'etiti umu Israel were umu-nne-gi, bú ndi Livai: ha buru onyinye, ndi enyere Jehova, ifè òfùfè nke ulo-ikwū nzute.


M'gēme ka onye-amuma, nke di ka gi, biliere ha site n'etiti umu-nne-ha; M'gētiye kwa okwum nile n'ọnu-ya, ọ gāgwa kwa ha okwu nile nke M'gēnye ya n'iwu.


N'ihi nka ka m'rapuru gi na Krit, ka i we dozie ihe fọduru, do kwa madu ndi-okenye n'obodo nile ọ bula, dika mu onwem nyere gi iwu;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan