Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ezra 8:15 - Bible Nso

15 M'we chikọta ha rue osimiri nke nērùbata n'Ahava; ayi we nọ n'ọmuma-ulo-ikwū n'ebe ahu ubọchi atọ: m'we mata ndi ahu, mata kwa ndi-nchu-àjà, ma ọ dighi onye nime umu Livai m'chọtara n'ebe ahu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Akpọkọtara m ha nʼakụkụ osimiri na-erubanye nʼAhava, anyị nọrọ nʼebe ahụ ụbọchị atọ. Mgbe m leruru anya nʼetiti ndị mmadụ zukọrọnụ, ha na ndị nchụaja bịara, a chọpụtara m na o nweghị ọ bụladị otu onye Livayị nọ nʼebe ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ezra 8:15
12 Iomraidhean Croise  

Ayi nēme kwa ka unu mara, na ọ dighi onye ka enyere ike n'aru ndi-nchu-àjà na ndi Livai ọ bula, ma-ọbu ndi nābù abù ọma, ma-ọbu ndi-ọnu-uzọ-ama, ma-ọbu Netinim, ma-ọbu ndi nēfè òfùfè nke ulo a nke Chineke, inara ha utu-ala, ma-ọbu utu-ahia, ma-ọbu utu-uzọ.


Onye setiwo-kwa-ra ebere-Ya n'ebe m'nọ n'iru eze na ndi nādu ya ọdu, na n'iru ndi-isi nile nke eze bu ndi-dike. M'we me onwem ka m'di ike dika aka Jehova, bú Chinekem, si di n'arum, m'we chikọputa n'Israel ndi-isi isorom rigo.


Ufọdu nime umu Israel na nime ndi-nchu-àjà na ndi Livai na ndi-ọbù-abù na ndi-ọnu-uzọ-ama na Netinim we rigorue Jerusalem n'arọ nke-asa nke Ataksakses, bú eze.


Site kwa n'umu Bigvai, Utai na Zabud; ndi soro ha di ọgu ndikom atọ na iri.


M'we zìe kpọ Elieza, kpọ kwa Ariel, kpọ kwa Shemaia, kpọ kwa Elnetan, kpọ kwa Jarib, kpọ kwa Elnetan, kpọ kwa Netan, kpọ kwa Zekaraia, kpọ kwa Meshulam, bú ndi-isi; m'kpọ kwa Joiarib, kpọ kwa Elnetan, bú ndi-nghọta.


Site n'umu Finehas, Giashom: site n'umu Itama, Daniel: site n'umu Devid, Hatush.


M'we kpọsa obubu-ọnu n'ebe ahu, n'akuku osimiri Ahava, iweda onwe-ayi n'ala n'iru Chineke-ayi ichọta n'aka-Ya uzọ ziri ezi nye onwe-ayi, nye kwa umu-ntakiri-ayi, nye kwa àkù-ayi nile.


Ayi we si n'osimiri Ahava n'ubọchi nke-iri-na-abua nke ọnwa mbu bulie ije, ijeru Jerusalem: aka Chineke-ayi we di n'aru ayi, O we naputa ayi n'aka onye-iro ọ bula na onye nēche anwu n'uzọ.


N'akuku osimiri nile nke Babilon, N'ebe ahu ka ayi nọduru ala, e, ayi kwara ákwá, Mb͕e ayi chetara Zaion.


O rue, n'arọ nke-orú-na-iri, n'ọnwa nke-anọ, n'ubọchi nke-ise nke ọnwa ahu, mb͕e mu onwem nọ n'etiti ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ n'akuku osimiri Keba, na emeghere elu-igwe, m'we hu ọhù di iche iche nke Chineke.


M'we biakute ndi ahu emere ka ha je biri n'ala ọzọ, na Tel-abib, bú ndi bi n'akuku osimiri Keba, m'we biarue ebe ha onwe-ha bi; m'we nọdu n'ebe ahu ubọchi asa n'anya o nējum n'etiti ha.


N'ubọchi-izu-ike ayi we pua n'ọnu-uzọ-ama obodo ga n'usọ otù osimiri, ebe ayi chère na ebe ekpere di; ayi we nọdu ala, we gwa ndinyom ndi b͕akọrọ okwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan