14 Site kwa n'umu Bigvai, Utai na Zabud; ndi soro ha di ọgu ndikom atọ na iri.
14 ndị sitere nʼikwu Bigvai, Utai na Zakua na iri ndị ikom asaa (70) bụ ndị so ha.
Umu Bigvai, nnù ise na ọgu abua na iri na isi.
Site kwa n'umu Adonikam, bú ndi-ikpe-azu; ndia bu kwa aha-ha, Elifelet, na Jeuel, na Shemaia; ndi soro ha di ọgu ndikom atọ.
M'we chikọta ha rue osimiri nke nērùbata n'Ahava; ayi we nọ n'ọmuma-ulo-ikwū n'ebe ahu ubọchi atọ: m'we mata ndi ahu, mata kwa ndi-nchu-àjà, ma ọ dighi onye nime umu Livai m'chọtara n'ebe ahu.
na Zakua, na Sherebia, na Shebania;
Umu Bigvai, nnù ise na ọgu atọ na asa.