Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ezra 8:1 - Bible Nso

1 Ma ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha, nka bu kwa akwukwọ-osuso-ọmumu nke ndi nēsom si na Babilon rigo, n'ọbubu-eze Ataksakses, bú eze.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Ndị a bụ usoro ọmụmụ ndịisi ezinaụlọ ahụ niile sooro m site na Babilọn laghachi mgbe Ataksekses bụ eze:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ezra 8:1
16 Iomraidhean Croise  

Ndia fe-kwa-ra nzà, ọbuná dika umu-nne-ha, bú umu Eron, fere, n'iru Devid, bú eze, na Zedok, na Ahimelek, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi-nchu-àjà na nke ndi Livai; ulo nke ndi bu nna nke onye-isi ọbuná dika nke nwa-nne-ya nke-ntà.


Ma umu-nne-ya, bú ndi-dìnkpà, di nnù ndikom isi na ọgu iri-na-ise, ndi-isi ulo nke ndi bu nna; Devid, bú eze, we me ka ha buru ndi-nlekọta ndi Reuben na ndi Gad na nkera ebo ndi Manase, bayere ihe nile nke Chineke na ihe nile nke eze.


na obodo ntà ha nile nke di obodo ahu buruburu, rue Beal. Ndia bu ebe-obibi-ha, ha nwe-kwa-ra akwukwọ-osuso-ọmumu-ha.


Ewe de Israel nile n'akwukwọ-osuso-ọmumu; ma, le, edere ha n'akwukwọ ndi-eze Israel: ma emere ka Juda je biri na Babilon n'ihi nmekpu ha mekpuru.


Ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ndi Livai n'osuso-ọmumu nile ha, ndi-isi: ndia biri na Jerusalem.


Ọnu-ọgugu nile nke ndi-isi ulo nke ndi bu nna, bú ndi-dike bu dìnkpà, di nnù isi na ọgu iri.


Ndi-isi ulo nke ndi bu nna Juda na Benjamin, na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, bú onye ọ bula Chineke kpọtere mọ-ya, we bilie irigo iwu ulo Jehova nke di na Jerusalem.


ndi ahu soro Zerubabel bia: bú Jeshua, Nehemaia, Seraia, Reelaia, Mọdekai, Bishan, Mispa, Bigvai, Rehum, Beana. Ọnu-ọgugu ndikom nke ndi Israel:


umu Parosh, nnù ise na ọgu asatọ na iri na abua.


Ndia chọrọ odide-akwukwọ-ha n'etiti ndi edere n'akwukwọ-osuso-ọmumu, ma achọtaghi ha: ewe gua ha na ndi nādighi nsọ, ewe wepu ha n'ọlu-nchu-àjà.


Esitewo n'akam nye iwu, na onye ọ bula nke nwere afọ-ofufo ije Jerusalem nime ndi Israel, na ndi-nchu-àjà-ha na ndi Livai, n'ala-ezem, ya so gi je.


Onye setiwo-kwa-ra ebere-Ya n'ebe m'nọ n'iru eze na ndi nādu ya ọdu, na n'iru ndi-isi nile nke eze bu ndi-dike. M'we me onwem ka m'di ike dika aka Jehova, bú Chinekem, si di n'arum, m'we chikọputa n'Israel ndi-isi isorom rigo.


Ezra nka siri na Babilon rigo; ma onye ahu bu ode-akwukwọ nke bu onye-ọ̀kà n'iwu Moses, nke Jehova, bú Chineke Israel, nyere: eze we nye ya ihe nile ọ riọrọ, dika aka Jehova, bú Chineke-ya, si di n'aru ya.


Ufọdu nime umu Israel na nime ndi-nchu-àjà na ndi Livai na ndi-ọbù-abù na ndi-ọnu-uzọ-ama na Netinim we rigorue Jerusalem n'arọ nke-asa nke Ataksakses, bú eze.


Site n'umu Finehas, Giashom: site n'umu Itama, Daniel: site n'umu Devid, Hatush.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan