Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ezra 7:15 - Bible Nso

15 na ibūru ọla-ọcha na ọla-edo nke eze na ndi nādu ya ọdu were afọ-ofufo nye Chineke Israel, Onye ebe-obibi-Ya di na Jerusalem,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Ọzọkwa, ịga e were onyinye ọlaedo na ọlaọcha ndị a eze na ndị ndụmọdụ ya ji afọ ofufu nye Chineke nke Izrel, onye ebe obibi ya dị na Jerusalem.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ezra 7:15
20 Iomraidhean Croise  

Ndi-isi ulo nke ndi bu nna, na ndi isi ebo Israel nile, na ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri, na nke usu nile nke ọgu ndikom ise, ọbuná rue ndi-isi ije-ozi eze, we were afọ-ofufo nye onwe-ha.


Ma ònye nwere ike iwuru Ya ulo, n'ihi na elu-igwe na elu-igwe nke elu-igwe nāgaghi-anagide Ya? ònye kwa ka mu onwem bu, na m'gēwuru Ya ulo, ma-ọbughi nání isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'iru Ya?


Ọtutu madu nēbute-kwa-ra Jehova onyinye-inata-iru-ọma, rue Jerusalem, ha nēbute-kwa-ra Hezekaia, bú eze Juda, ihe di oké ọnu-ahia: ewe bulie ya elu n'anya mba nile mb͕e ihe ndia gasiri.


Ma mu onwem ewuworo Gi ulo obibi, bú ọnọdu guzosiri ike ebe I gēbi rue mb͕e ebighi-ebi.


ma arọputaram Jerusalem, ka aham we di n'ebe ahu; arọputa-kwa-ram Devid ibu onye-isi ndim, bú Israel.


Ndi nile nke nọ ha buruburu we were ihe ọla-ọcha na ọla-edo na àkù na anu-ulo na ihe di oké ọnu-ahia, nāgughi ihe nile enyere n'afọ-ofufo, me ka aka-ha di ike.


Chineke kwa Nke mere aha-Ya ka o biri n'ebe ahu, Ya tudà eze na ndi ọ bula nke gēseti aka-ya ib͕anwe okwu a, na ime ka ulo a nke Chineke nke di na Jerusalem la n'iyì. Mu onwem, bú Dariọs, enyewo iwu; ka ewere ngwa ngwa me ya.


akuku atọ nke nkume nkpọrè, na otù ariri osisi ọhu: ka esi kwa n'ulo eze nye ego iji lu ọlu ahu:


N'ihi na anēsi n'iru eze na madu asa ndi nādu ya ọdu ziga gi iwere iwu Chineke-gi nke di n'aka-gi ju ajuju bayere Juda, baye-kwa-ra Jerusalem;


m'we tùara ha ọla-ọcha ahu, na ọla-edo ahu, na ihe ahu nile, bú àjà-nbuli nke ulo Chineke-ayi, nke eze, na ndi nādu ya ọdu, na ndi-isi-ya, na Israel nile ahuru n'ebe ahu, buliri:


Onye agọziri agọzi ha Jehova bu site na Zaion, Onye bi na Jerusalem. Tonu Ja.


Jehova, ahuwom ebe-obibi nke ulo-gi n'anya, Ya na ọnọdu nke ebe-obibi nke ebube-Gi.


Ndi-eze Tashish na nke ala nile di oké osimiri buruburu gēnye onyinye-inata-iru-ọma: Ndi-eze Sheba na Seba gēweta ùtú nso.


Kwenu nkwa, kwughachi kwa Jehova, bú Chineke-unu: Ka ndi nile ndi nọ Ya buruburu bukue onye ahu di egwu abu.


Ọ bu kwa na Selem ka ulo-ntu-Ya di Ebe-obibi-Ya di kwa na Zaion.


Bùkuenu Jehova abù ọma, bú Onye bi na Zaion: Gosinu omume-Ya nile n'etiti ndi nile di iche iche.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan