Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ezra 7:12 - Bible Nso

12 Ataksakses, bú eze nāchi ndi-eze, nēdegara Ezra akwukwọ, bú onye-nchu-àjà, bú ode-akwukwọ nke iwu Chineke nke elu-igwe, onye zuru okè, na ihe ọzọ di otú a.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Ataksekses, eze na-achị ndị eze ọzọ, na-edegara Ezra akwụkwọ, bụ onye nchụaja, bụrụkwa onye nkuzi okwu Chineke nke eluigwe. Ndeewo!

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ezra 7:12
15 Iomraidhean Croise  

Ma Ben-hedad, bú eze Siria, chikọtara usu-ndi-agha-ya nile: orú ndi-eze na iri na abua soro kwa ya, ha na inyinya na ub͕ọ-ala: o we rigo, nọchigide Sameria n'agha, buso ya agha.


N'ihi na ya onwe-ya nwere ike n'aru ndi nile bi n'ofè Osimiri, site na Tifsa we rue Geza, bú n'aru eze nile n'ofè Osimiri: o nwe-kwa-ra udo site n'ofè ọzọ nile di ya buruburu.


Otú a ka Sairọs, bú eze Peasia, siri, Ala-eze nile nke uwa ka Jehova, bú Chineke elu-igwe, nyeworom; Ya onwe-ya me-kwa-ram ka m'buru onye-nlekọta n'iwuru Ya ulo nime Jerusalem, nke di na Juda.


Eze zigara Rehum, bú onye-nwe ikpé, na Shimshai, bú ode-akwukwọ, na ndi-òtù-ha fọduru ndi bi na Sameria, na ndi fọduru n'ofè osimiri, Udo, na ihe ọzọ di otú a.


Ma mb͕e ihe ndia gasiri, n'ọbubu-eze nke Ataksakses, bú eze Peasia, Ezra nwa Seraia, nwa Azaraia, nwa Hilkaia,


Ma nka bu ndeputa akwukwọ-ozi ahu nke eze, bú Ataksakses, nyere Ezra, bú onye-nchu-aja, bú ode-akwukwọ, ọbuná ode-akwukwọ nke okwu nile nke ihe nile Jehova nyere n'iwu, na nke ukpuru-Ya nile O nyere Israel.


Ezra nka siri na Babilon rigo; ma onye ahu bu ode-akwukwọ nke bu onye-ọ̀kà n'iwu Moses, nke Jehova, bú Chineke Israel, nyere: eze we nye ya ihe nile ọ riọrọ, dika aka Jehova, bú Chineke-ya, si di n'aru ya.


N'ihi na ọ nāsi, Ndi-isim, hà nile abughi ndi-eze?


N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, M'gaje ime ka Nebukadreza, bú eze Babilon, si n'Ugwu biarue Taia, ọ bu eze nke ndi-eze, ọ gāchiri inyinya, chiri kwa ub͕ọ-ala, chiri kwa ndi-inyinya na nkpọkọta madu na ndi bara uba, bia.


Gi onwe-gi, eze, bu eze ndi-eze, onye Chineke nke elu-igwe nyeworo ala-eze a na àkù a na ike a na ebube a;


Eze zara Daniel, si, N'ezi-okwu Chineke-unu bu Chineke nke chi nile, na Onye-nwe ndi-eze, na Onye nēkpughe ihe-nzuzo nile, ebe i puru ikpughe ihe-nzuzo a.


nke Ọ gēgosi n'oge nke aka Ya, Onye nání Ya bu Onye di ike, Onye bu kwa onye di ngọzi, bú Eze kachasi ndi bu eze, Onye bu kwa Onye-nwenu kachasi ndi nāchi ka ndi-nwe madu;


Ndia gēbu agha megide Nwa-aturu ahu, Nwa-aturu ahu gēmeri kwa ha, n'ihi na Ọ bu Onye-nwenu kachasi ndi-nwenu nile, na Eze kachasi ndi-eze nile; ndi soro Ya gēmeri kwa, bú ndi akpọworo, ndi arọputawo-kwa-ra, ndi kwesi-kwa-ra ntukwasi-obi.


O nwe-kwa-ra aha edekwasiworo n'elu uwe-Ya na n'elu apata-ukwu-Ya, EZE kachasi NDI-EZE nile, NA ONYE-NWENU kachasi NDI-NWENU nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan