Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ezra 6:13 - Bible Nso

13 Mb͕e ahu Tatenai, bú onye nāchi ala n'ofè osimiri, na Sheta-bozenai, na ndi-òtù-ha, dika ozi ahu si di nke Daraiọs, bú eze, ziri, otú a ka ha were ngwa ngwa me.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Ya mere, nʼihi iwu ahụ eze Daraiọs zitere, Tatenai, onyeisi ọchịchị nʼala ofe mmiri, na Sheta Bozenai, na ndị otu ha, mere ihe niile dịka ozi ahụ si dị na-atụfughị oge ọbụla.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ezra 6:13
9 Iomraidhean Croise  

Mb͕e ahu site na mb͕e aguru ndeputa akwukwọ-ozi nke Ataksakses, bú eze, n'iru Rehum, na Shimshai, bú ode-akwukwọ, na ndi-òtù-ha, ha were ngwa ngwa jerue Jerusalem, jekuru ndi-Ju, were ihe-ike na usu-ndi-agha me ka ha kwusi.


mb͕e ahu ha dere akwukwọ, bú Rehum, bú onye-nwe ikpe, na Shimshai, bú ode-akwukwọ, na ndi-òtù-ha fọduru, bú ndi-Dinait, na ndi-Afasatkait, na ndi-Tapelait, na ndi-Afasait, na ni-Akevait, na ndi Babilon, na ndi Shushan, na ndi-Dehait, na ndi Ilam,


Na mb͕e ahu Tatenai, bú onye nāchi ala n'ofè osimiri, na Sheta-bozenai, na ndi-òtù-ha, biakutere ha, we si ha otú a, Ònye nyere unu iwu iwu ulo a, na iluzu mb͕idi a?


Ndeputa akwukwọ-ozi nke Tatenai, bú onye nāchi ala n'ofè osimiri, na Sheta-bozenai, na ndi-òtù-ya, bú ndi-Afasakait, ndi nọ n'ofè osimiri, zigara Daraiọs, bú eze.


Ub͕u a, Tatenai, bú onye nāchi ala n'ofè osimiri, na Sheta-bozenai, na ndi-òtù-ha, bú ndi-Afasakait, ndi nọ n'ofè osimiri, dinu n'ebe di anya site n'ebe ahu:


Heman we chiri uwe ahu na inyinya ahu, yikwasi Mọdekai, me ka inyinya būru ya ga n'amá obodo, ọ kpọ-kwa-ra n'iru ya, si, Otú a ka agēmere nwoke ahu nke nsọpuru-ya tọworo eze utọ.


Ọtutu madu nāchọ iru onye nāchi achi: Ma n'aka Jehova ka ikpé onye ọ bula nēsi bia.


N'ihi na okwu eze nwere ike; ònye gāsi kwa ya, Gini ka i nēme?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan