Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ezra 5:16 - Bible Nso

16 Mb͕e ahu Sheshbaza ahu biara, tọ ntọ-ala nile nke ulo Chineke nke di na Jerusalem: ma site na mb͕e ahu we rue ub͕u a ka anēwu ya, ma ewuzughi ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 “Ya mere, ọ bụ Sheshbaza a bịara tọọ ntọala ụlọnsọ dị na Jerusalem. Sitekwa nʼoge ahụ ruo ugbu a, ha nọ na-arụ ya ma ha arụchabeghị ya.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ezra 5:16
11 Iomraidhean Croise  

Ma mb͕e ndi nēwu ulo tọrọ ntọ-ala ulo no, uku Jehova, ha we guzo ndi-nchu-àjà n'uwe-ha chiri opì, na ndi Livai, bú umu Esaf, chiri ájà, ito Jehova, dika ukpuru Devid, bú eze Israel, si di.


Ma n'arọ nke-abua nke ọbibia-ha nke ha biaruru ulo Chineke nime Jerusalem, n'ọnwa nke-abua, ha malitere, bú Zerubabel nwa Shealitiel, na Jeshua nwa Jozadak, na ndi fọduru n'umu-nne-ha, bú ndi-nchu-àjà na ndi Livai, na ndi nile ndi nēsi na ndọta-n'agha ahu bia na Jerusalem; ha we guzo ndi Livai, site n'onye b͕ara orú arọ ga n'iru, ibu ndi-isi n'ije-ozi nke ulo Jehova.


Ọzọ kwa, ihe nile nke ulo Chineke, nke ọla-edo na nke ọla-ọcha, nke Nebukadneza chiputara n'ulo uku Chineke di na Jerusalem, chibata ha n'ulo uku nke Babilon, ihe ahu ka Sairọs, bú eze, chiputara n'ulo uku Babilon, nye ha n'aka otù onye, Sheshbaza bu aha-ya, onye o mere onye nāchi ala;


ọ si ya, Chiri ihe ndia, je, dọba ha n'ulo uku Chineke ahu nke di na Jerusalem, ka ewu kwa ulo Chineke n'ọnọdu-ya.


Mb͕e ahu Zerubabel nwa Shealtiel, na Jeshua nwa Jozadak, biliri, we malite iwu ulo Chineke nke di na Jerusalem; ndi-amuma Chineke nọye-kwa-ra ha, nēnye ha ume.


Ma n'ubọchi nke-atọ nke ọnwa Ada, nke di n'arọ nke-isi nke ọbubu-eze Daraiọs, bú eze, ka ewuchara ulo a.


Biko, tukwasinu obi-unu na mb͕e a, site n'ubọchi ta laghachi azu, site n'ubọchi nke-orú-na-anọ nke ọnwa nke-iteghete, site n'ubọchi ahu mb͕e atọrọ ntọ-ala ulo uku Jehova, tukwasinu obi-unu na ya.


N'ihi na ònye ledaworo ubọchi ihe ntà anya? n'ihi na ha gāṅuri ọṅu, hu nkume eji atù mb͕idi n'aka Zerubabel, bú asa ndia, ndi bu anya Jehova; ndi ahu nējeghari n'uwa nile.


Aka abua nke Zerubabel atọwo ntọ-ala nke ulo a, aka-ya abua gēwubì kwa ya; i we mara na Jehova nke usu nile nke ndi-agha ezìwom biakute unu.


Ya mere ndi-Ju siri, Ọgu arọ abua na isi ka eji wu ulo nsọ a, Gì onwe-gi gēweli kwa ya n'ubọchi atọ?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan