Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ezra 4:7 - Bible Nso

7 N'ubọchi Ataksakses ka Bishlam na Mitredat na Tabeel na ndi-òtù-ya fọduru degara Ataksakses, bú eze Peasia, akwukwọ; ma edewo odide akwukwọ-ozi ahu n'asusu Siria, asughariwo kwa ya n'asusu Siria.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Nʼụbọchị niile ahụ Ataksekses bụ eze ndị Peshịa, ka Bishlam, na Mitredat, na Tabeel, na ndị otu ya fọdụrụ degaara Ataksekses akwụkwọ. E dere akwụkwọ ozi ahụ nʼodide akwụkwọ ndị Aramaik, a sụgharịkwara ya nʼasụsụ Aramaik.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ezra 4:7
12 Iomraidhean Croise  

Jehovah sirim, Rigo imegide ala nka, bilie ya. Elaiakim nwa Hilkaia, na Shebna, na Joa, we si Rabshake, Biko, gwa ndi orù-gi okwu n'asusu Siria; n'ihi na ayi onwe-ayi nānu ya: akpaye-kwa-la ayi uka n'asusu ndi-Ju, na nti ndi nọ n'elu mb͕idi.


Ndi nākpab͕u Juda na Benjamin we nu na umu ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ nēwuru Jehova, bú Chineke Israel, ulo uku;


Eze zigara Rehum, bú onye-nwe ikpé, na Shimshai, bú ode-akwukwọ, na ndi-òtù-ha fọduru ndi bi na Sameria, na ndi fọduru n'ofè osimiri, Udo, na ihe ọzọ di otú a.


Rehum, bú onye-nwe ikpé, na Shimshai, bú ode-akwukwọ, degara Ataksakses, bú eze, akwukwọ-ozi imegide Jerusalem otú a:


mb͕e ahu ha dere akwukwọ, bú Rehum, bú onye-nwe ikpe, na Shimshai, bú ode-akwukwọ, na ndi-òtù-ha fọduru, bú ndi-Dinait, na ndi-Afasatkait, na ndi-Tapelait, na ndi-Afasait, na ni-Akevait, na ndi Babilon, na ndi Shushan, na ndi-Dehait, na ndi Ilam,


Ndeputa akwukwọ-ozi nke Tatenai, bú onye nāchi ala n'ofè osimiri, na Sheta-bozenai, na ndi-òtù-ya, bú ndi-Afasakait, ndi nọ n'ofè osimiri, zigara Daraiọs, bú eze.


Ma mb͕e ihe ndia gasiri, n'ọbubu-eze nke Ataksakses, bú eze Peasia, Ezra nwa Seraia, nwa Azaraia, nwa Hilkaia,


Ha we nye ndi nọchiri anya eze na ndi nāchi ala n'ofè osimiri iwu nile nke eze: ha we yere ndi-Ju na ulo Chineke aka.


O rue n'ọnwa Nisan, n'arọ nke-orú nke Ataksakses, bú eze, na manya-vine di n'iru ya, m'we buru manya-vine ahu, nye eze. Ma akaghm-ajọ njọ n'obi n'iru ya.


Elaiakim na Shebna na Joa we si Rabshake, Biko, gwa ndi-orù-gi okwu n'asusu Siria; n'ihi na ayi onwe-ayi nānu ya: agwa-kwa-la ayi okwu n'asusu ndi-Ju, na nti ndi nọ n'elu mb͕idi.


Ma ub͕u a ezi-okwu ka m'gēgosi gi. Le, ndi-eze atọ ọzọ ganēguzoro Peasia ọtọ; ma nke-anọ gābu ọgaranya nwe àkù uku kari ha nile: ma mb͕e emere ka ọ di ike site n'àkù-ya, ọ gākpọte ndi-ya nile imegide ala-eze Jevan.


Ndi Kaldea we si eze n'asusu Siria, Eze, di ndu rue mb͕e ebighi-ebi: zere ndi-orù-gi nrọ ahu, isi-ya ka ayi gākọ kwa.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan