Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ezra 4:24 - Bible Nso

24 Mb͕e ahu ọlu ulo Chineke nke di na Jerusalem kwusiri; o we kwusi rue arọ nke-abua nke ọbubu-eze nke Daraiọs, bú eze Peasia.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 Ya mere, ha kwụsịrị ịrụ ọrụ nʼụlọnsọ ukwu Chineke na Jerusalem tutu ruo nʼafọ abụọ nke ọchịchị Daraiọs eze Peshịa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ezra 4:24
19 Iomraidhean Croise  

Ma n'arọ nke-abua nke ọbibia-ha nke ha biaruru ulo Chineke nime Jerusalem, n'ọnwa nke-abua, ha malitere, bú Zerubabel nwa Shealitiel, na Jeshua nwa Jozadak, na ndi fọduru n'umu-nne-ha, bú ndi-nchu-àjà na ndi Livai, na ndi nile ndi nēsi na ndọta-n'agha ahu bia na Jerusalem; ha we guzo ndi Livai, site n'onye b͕ara orú arọ ga n'iru, ibu ndi-isi n'ije-ozi nke ulo Jehova.


Mb͕e ahu site na mb͕e aguru ndeputa akwukwọ-ozi nke Ataksakses, bú eze, n'iru Rehum, na Shimshai, bú ode-akwukwọ, na ndi-òtù-ha, ha were ngwa ngwa jerue Jerusalem, jekuru ndi-Ju, were ihe-ike na usu-ndi-agha me ka ha kwusi.


ha nēgota kwa ndi nādu ọdu megide ha, imebi idu-ọdu-ha, ubọchi nile nke Sairọs, bú eze Peasia, ọbuná rue ọbubu-eze nke Daraiọs, bú eze Peasia.


Ma ndi-amuma, bú Hagai onye-amuma, na Zekaraia nwa Ido, buru amuma nye ndi-Ju ndi nọ na Juda na nime Jerusalem; ọ bu n'aha Chineke Israel ka ha buru amuma nye ha.


Ma anya Chineke-ha di n'aru ndi-okenye ndi-Ju, ha we ghara ime ka ha kwusi, rue mb͕e okwu ahu jeruru Daraiọs nti: mb͕e ahu ha we zighachi akwukwọ-ozi bayere ihe a.


Mb͕e ahu Daraiọs, bú eze, nyere iwu, ha we chọ n'ulo akwukwọ, ebe adọbara àkù nime Babilon.


Ma ndi-okenye nke ndi-Ju nēwu ulo, ihe nāga-kwa-ra ha nke-ọma, site n'ibu-amuma nke Hagai, bú onye-amuma, na Zekaraia nwa Ido. Ha we wue, wuzu kwa ya, site n'ihe Chineke Israel nyere n'iwu, na site n'ihe Sairọs na Daraiọs na Ataksakses, bú eze Peasia, nyere n'iwu.


Ma n'ubọchi nke-atọ nke ọnwa Ada, nke di n'arọ nke-isi nke ọbubu-eze Daraiọs, bú eze, ka ewuchara ulo a.


M'we zigara ha ndi-ozi, si, Ozi uku ka m'nēje, apughkwam irida: n'ìhi gini ka ozi a gākwusi, mb͕e m'nārapu ya, we ridakuru unu?


N'ihi na ha nile nēme ka ayi tua egwu, si, Aka-ha gākudapu n'ije-ozi a, agaghi-eje kwa ya. Ma ub͕u a Gi me ka akam abua di ike.


Na iti-nkpu-ọǹù nke ndi nēmebi iwu di nkpunkpu, Na ọṅù nke onye emeruru emeru nādi kwa rue mb͕e ntabi-anya?


Ma ub͕u a ezi-okwu ka m'gēgosi gi. Le, ndi-eze atọ ọzọ ganēguzoro Peasia ọtọ; ma nke-anọ gābu ọgaranya nwe àkù uku kari ha nile: ma mb͕e emere ka ọ di ike site n'àkù-ya, ọ gākpọte ndi-ya nile imegide ala-eze Jevan.


Ma mara, were kwa uche mata, na site na nputa okwu ahu iwughachi na iwuzi Jerusalem rue mb͕e onye etere manu, bú onye-ndú, gādi ízù asa: na ọgu atọ na abua, agēwuzi kwa ya ọzọ, ya na amá na ékpè, ọbuná na nkpà nke mb͕e ndia.


N'arọ nke-abua nke Daraiọs, bú eze, n'ọnwa nke-isi, n'ubọchi mbu n'ọnwa, ka okwu Jehova si n'aka Hagai, bú onye-amuma, rue Zerubabel nwa Shealtiel, bú onye nāchi ala Juda, ru kwa Joshua nwa Jehozadak, bú onye-isi-nchu-àjà, nti, si,


n'ubọchi nke-orú-na-anọ nke ọnwa ahu, n'ọnwa nke-isi, n'arọ nke-abua nke Daraiọs, bú eze.


Ma ub͕u a, biko, tukwasinu obi-unu na mb͕e a site n'ubọchi ta laghachi azu, site na mb͕e akātukwasighi nkume n'elu nkume n'ulo uku Jehova:


Biko, tukwasinu obi-unu na mb͕e a, site n'ubọchi ta laghachi azu, site n'ubọchi nke-orú-na-anọ nke ọnwa nke-iteghete, site n'ubọchi ahu mb͕e atọrọ ntọ-ala ulo uku Jehova, tukwasinu obi-unu na ya.


N'ọnwa nke-asatọ, n'arọ nke-abua nke Daraiọs, ka okwu Jehova ruru Zekaraia nwa Berekaia, nwa Ido, bú onye-amuma, nti, si,


n'ihi na ayi chọrọ ibiakute unu, mu onwem, bú Pọl, otù mb͕e na mb͕e ọzọ; Setan b͕ochikwara ayi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan