Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ezra 4:16 - Bible Nso

16 Ayi onwe-ayi nēme ka eze mara na, ọ buru na ewue obodo a, luzu kwa mb͕idi-ya nile, n'ihi ya ọ dighi òkè i gēnwe n'ofè osimiri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Anyị chọrọ ka ị mata na ọ bụrụ na e wuchaa mgbidi obodo a, ọ ga-esi ike ka akụkụ alaeze gị a, nke dị ruo nʼosimiri Yufretis, bụrụkwa nke gị ọzọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ezra 4:16
5 Iomraidhean Croise  

Devid tib͕u-kwa-ra Hedadeza nwa Rehob, bú eze Zoba, mb͕e ọ nēje iweghachi ike-ya n'akuku Osimiri.


N'ihi na ya onwe-ya nwere ike n'aru ndi nile bi n'ofè Osimiri, site na Tifsa we rue Geza, bú n'aru eze nile n'ofè Osimiri: o nwe-kwa-ra udo site n'ofè ọzọ nile di ya buruburu.


ka ewe chọ n'akwukwọ ihe-ncheta nke nna-gi-hà: i we chọta n'akwukwọ ihe-ncheta, mara kwa, na obodo a bu obodo na-enupu isi, nke nēme kwa ka ihe funari ndi-eze na ala nile anāchi achi, na ndi nākpali madu imegide ndi-isi nọ kwa n'etiti ya na mb͕e ochie: ọ bu n'ihi ya ka emere obodo a ka ọ buru nkpọnkpọ-ebe.


Eze zigara Rehum, bú onye-nwe ikpé, na Shimshai, bú ode-akwukwọ, na ndi-òtù-ha fọduru ndi bi na Sameria, na ndi fọduru n'ofè osimiri, Udo, na ihe ọzọ di otú a.


Ndi-eze di ike abuwo kwa ndi-isi Jerusalem, bú ndi nwere ike n'aru ndi nile nọ n'ofè osimiri; anēnye kwa ha utu-ala na utu-ahia na utu-uzọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan