Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ezra 4:12 - Bible Nso

12 Ka eze mara, na ndi-Ju, bú ndi siri n'ebe i nọ rigokute ayi, ha abawo na Jerusalem; ha nēwu obodo ahu nke nupuru isi nēsì kwa ísì, ha ewubìwo mb͕idi-ya nile, jikọta ntọ-ala-ya nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Nke a bụ ime ka ị mata na ndị Juu si Babilọn lọta Jerusalem ọhụrụ a ebidola iwughachi obodo ọjọọ nke nnupu isi ahụ. Ha ewuolarị mgbidi ya, tọkwaa ntọala ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ezra 4:12
22 Iomraidhean Croise  

I nāsi, (ma ọ bu nání okwu eb͕ub͕ere-ọnu) Ndum-ọdu na idi-ike di iji bu agha. Ub͕u a ònye ka i tukwasiworo obi, na i nupuwo isi n'okpurum?


N'ubọchi-ya Nebukadneza, bú eze Babilon, rigoro, Jehoiakim we ghọrọ ya orù arọ atọ: o we chigharia nupu isi n'okpuru ya.


Ọzọ kwa, o nupuru isi n'okpuru eze, bú Nebukadneza, onye mere ka o were Chineke ṅua iyi: o we kwesie olu-ya ike, b͕a obi-ya ume, ka ọ ghara ichigharikute Jehova, bú Chineke Israel.


Nka bu ndeputa edeputara n'akukwọ-ozi ahu nke ha zigara ya, bú Ataksakses, bú eze; Ndi-orù-gi, bú ndikom n'ofè osimiri, na ihe ọzọ di otú a.


ka ewe chọ n'akwukwọ ihe-ncheta nke nna-gi-hà: i we chọta n'akwukwọ ihe-ncheta, mara kwa, na obodo a bu obodo na-enupu isi, nke nēme kwa ka ihe funari ndi-eze na ala nile anāchi achi, na ndi nākpali madu imegide ndi-isi nọ kwa n'etiti ya na mb͕e ochie: ọ bu n'ihi ya ka emere obodo a ka ọ buru nkpọnkpọ-ebe.


M'we nye iwu, ewe chọ, chọputa na obodo a, site n'ubọchi nile nke mb͕e ochie, nēbuli onwe-ya imegide ndi-eze, anākpali kwa madu inupu isi na imegide ndi-isi nime ya.


Na mb͕e ahu Tatenai, bú onye nāchi ala n'ofè osimiri, na Sheta-bozenai, na ndi-òtù-ha, biakutere ha, we si ha otú a, Ònye nyere unu iwu iwu ulo a, na iluzu mb͕idi a?


Mb͕e ahu ayi juru ndi-okenye ahu, si ha otú a, Ònye nyere unu iwu iwu ulo a, iluzu mb͕idi a?


Ha we sim, Ndi fọduru, bú ndi fọduru site na ndọta-n'agha n'ebe ahu n'ala ahu anāchi achi nọ n'ọnọdu ọjọ na n'ita-uta: etipúsi-kwa-ra mb͕idi Jerusalem, sure kwa ọnu-uzọ-ama-ya nile ọku.


edewo nime ya, si, Anuwo ya n'etiti mba nile ọzọ, Gashmu nāsi kwa, na gi onwe-gi na ndi-Ju nēchè èchìchè inupu isi; n'ihi nka ka gi onwe-gi nālu mb͕idi ahu: gi onwe-gi aghọwo-kwa-ra ha eze, dika okwu ndia si di.


Heman we si eze, bú Ahasuerọs, Otù ndi di ndi emeworo ka ha b͕asa, ndi ekesawo-kwa-ra ha n'etiti ndi di iche iche n'ala nile anāchi achi nke ala-eze-gi; iwu nile ha di kwa iche n'iwu ndi ọ bula; ha adighi-edebe kwa iwu nile nke eze: o kwesighi kwa eze ka o kwe ka ha nọduru onwe-ha.


N'ihi na ọ bu n'ihi iwe Jehova ka ọ di otú a nime Jerusalem na Juda, rue mb͕e O siri n'iru Ya chupu ha: Zedekaia we nupu isi n'okpuru eze Babilon.


N'ihi nka ka ndi Kaldea ufọdu biaruru nso n'otù mb͕e ahu, bo ndi-Ju ebubo.


Ma mara, were kwa uche mata, na site na nputa okwu ahu iwughachi na iwuzi Jerusalem rue mb͕e onye etere manu, bú onye-ndú, gādi ízù asa: na ọgu atọ na abua, agēwuzi kwa ya ọzọ, ya na amá na ékpè, ọbuná na nkpà nke mb͕e ndia.


Jerusalem, Jerusalem, nke nēb͕u ndi-amuma, nke nēwere kwa nkume atu ndi eziteworo ya! ọ̀tutu mb͕e ole ka M'chọrọ ichikọ umu-gi, ọbuná dika nnekwu-ọkuku nāchikọ umu nke aka ya n'okpuru nkù-ya abua, ma unu achọghi!


N'ihi na ayi huru nwoke a ka ọ nābu onye nēme ka ihe ọjọ ba uba, onye nākpali kwa madu n'etiti ndi-Ju nile n'elu-uwa dum madu bi ka ha bilie megide ndi-isi, buru kwa otù onye-isi nime irọ-òtù ndi Nazaret:


unu etiyela aka n'aha ajọ ihe ọ bula.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan