Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ezra 3:8 - Bible Nso

8 Ma n'arọ nke-abua nke ọbibia-ha nke ha biaruru ulo Chineke nime Jerusalem, n'ọnwa nke-abua, ha malitere, bú Zerubabel nwa Shealitiel, na Jeshua nwa Jozadak, na ndi fọduru n'umu-nne-ha, bú ndi-nchu-àjà na ndi Livai, na ndi nile ndi nēsi na ndọta-n'agha ahu bia na Jerusalem; ha we guzo ndi Livai, site n'onye b͕ara orú arọ ga n'iru, ibu ndi-isi n'ije-ozi nke ulo Jehova.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Nʼọnwa nke abụọ nke afọ abụọ site mgbe ha bịarutere nʼụlọ Chineke na Jerusalem. Mmadụ niile ahụ lọtara Juda so rụọ ọrụ. Zerubabel nwa Shealtiel, Jeshua nwa Jozadak na ndị fọdụrụ na ụmụnne ha, bụ ndị nchụaja na ndị Livayị, na ndị niile si na ndọta nʼagha lọta Jerusalem, malitere ịrụ ọrụ ahụ. Ha họpụtara ndị Livayị niile gbara iri afọ abụọ rigoo ka ha lekọta ihe banyere ọrụ ụlọ Onyenwe anyị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ezra 3:8
14 Iomraidhean Croise  

Nime ndia ndi ọlu-ha bu ichi achi n'ije-ozi ulo Jehova di orú nnù uzọ atọ; nnù ndikom iri-na-ise bu ndi-odozi-okwu na ndi-ikpe:


Umu-ndikom Jekonaia kwa, bú onye-nkpọrọ: Shealtiel nwa-ya,


Ewe chọta ufọdu n'etiti umu ndi-nchu-àjà ndi lutaworo ndinyom ala ọzọ: bú, n'etiti umu Jeshua, nwa Jozadak, na umu-nne-ya: Maaseia, na Elieza, na Jarib, na Gedalaia.


ndi ahu soro Zerubabel bia: bú Jeshua, Nehemaia, Seraia, Reelaia, Mọdekai, Bishan, Mispa, Bigvai, Rehum, Beana. Ọnu-ọgugu ndikom nke ndi Israel:


Jeshua nwa Jozadak, na umu-nne-ya, bú ndi-nchu-àjà, na Zerubabel nwa Shealtiel, na umu-nne-ya, we bilie, wue ebe-ichu-àjà Chineke Israel, isure àjà-nsure-ọku n'elu ya, dika edeworo ya n'iwu Moses, bú onye nke Chineke.


Mb͕e ahu ọlu ulo Chineke nke di na Jerusalem kwusiri; o we kwusi rue arọ nke-abua nke ọbubu-eze nke Daraiọs, bú eze Peasia.


Zerubabel na Jeshua na ndi fọduru nke ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke Israel we si ha, Ọ dighi nke ayi na unu nwekọrọ n'iwuru Chineke-ayi ulo; kama ayi onwe-ayi gēwukwara Jehova, bú Chineke Israel, ulo, dika eze, bú Sairọs eze Peasia, nyere ayi iwu.


Mb͕e ahu Sheshbaza ahu biara, tọ ntọ-ala nile nke ulo Chineke nke di na Jerusalem: ma site na mb͕e ahu we rue ub͕u a ka anēwu ya, ma ewuzughi ya.


Mb͕e ahu Zerubabel nwa Shealtiel, na Jeshua nwa Jozadak, biliri, we malite iwu ulo Chineke nke di na Jerusalem; ndi-amuma Chineke nọye-kwa-ra ha, nēnye ha ume.


N'arọ nke-abua nke Daraiọs, bú eze, n'ọnwa nke-isi, n'ubọchi mbu n'ọnwa, ka okwu Jehova si n'aka Hagai, bú onye-amuma, rue Zerubabel nwa Shealtiel, bú onye nāchi ala Juda, ru kwa Joshua nwa Jehozadak, bú onye-isi-nchu-àjà, nti, si,


Aka abua nke Zerubabel atọwo ntọ-ala nke ulo a, aka-ya abua gēwubì kwa ya; i we mara na Jehova nke usu nile nke ndi-agha ezìwom biakute unu.


gwa ya okwu, si, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha kwuru, si, Le, otù onye nke Ihe-opupú bu aha-ya; ọ bu kwa n'ọnọdu-ya ka ọ gēsi pú, ọ gēwu kwa ulo uku Jehova:


site n'onye b͕ara orú arọ na iri we gaba n'iru we rue onye b͕ara ọgu arọ abua na iri, onye ọ bula nke nābakuru usu-ndi-agha, ije ozi n'ulo-ikwū nzute.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan