Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ezra 2:68 - Bible Nso

68 Ma ufọdu n'etiti ndi-isi ulo nke ndi bu nna, mb͕e ha biaruru ulo Jehova nke di na Jerusalem, ha nyere onwe-ha n'afọ-ofufo iwu ulo Chineke ime ka o guzo n'ọnọdu-ya:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

68 Mgbe ha bịarutere nʼụlọ Onyenwe anyị dị na Jerusalem, ụfọdụ nʼime ndịisi ezinaụlọ nyere onyinye afọ ofufu maka i ji rụzie ụlọ Chineke ka o guzo nʼọnọdụ ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ezra 2:68
20 Iomraidhean Croise  

Mọ-ozi nke Jehova we si Gad ka ọ si Devid ka Devid rigo, me ka ebe-ichu-àjà guzoro Jehova n'ebe-nzọcha-ọka nke Ọnan onye Jebus.


Devid we si, Nka bu ulo Jehova, bú Chineke, nka bu-kwa-ra Israel ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku.


Solomon we malite iwu ulo Jehova nime Jerusalem n'ugwu Moraia, ebe Jehova mere ka Devid, bú nna-ya, hu Ya anya, nke o doziri n'ebe Devid rọputara, n'ebe-nzọcha-ọka Ọnan, bú onye Jebus.


camel-ha di nnù na orú na iri na ise; inyinya-ibu-ha di nnù iri-na-isi na ọgu iri-na-isi.


dika ike-ha si di ka ha tiyere n'ulo-àkù nke ije-ozi ahu orú nnù daric ọla-edo uzọ asa na nnù iri-na-abua na ọgu iri, na nnù pound ọla-ọcha iri-na-abua na ọgu iri, na ọgu uwe ndi-nchu-àjà ise.


Ha we me ka ebe-ichu-àjà guzosie ike n'ebe-ndọkwasi-ya nile; nihi na oké ujọ di n'aru ha n'ihi ndi ala ahu nile: ha we surere Jehova àjà-nsure-ọku n'elu ya, bú àjà-nsure-ọku anēsure ututu na anyasi.


N'ihi na ndi-orù ka ayi bu; ma Chineke-ayi arapughi ayi n'ọbubu-orù-ayi, kama O setiwo ebere rue ayi aru n'iru ndi-eze Peasia, idebere ayi ndu, iwuli ulo Chineke-ayi elu, na ime ka nkpọnkpọ-ebe-ya nile guzo, na inye ayi mb͕idi nime Juda na nime Jerusalem.


Ndi-gi bu onyinye-afọ-ofufo n'ubọchi usu-ndi-agha-gi; N'ima-nma nile nke idi-nsọ, site n'afọ nke ututu; Gi nwe igirigi, bú umu-okorọbia-gi.


Gwa umu Israel ka ha wetara m àjà-nbuli: n'aka nwoke ọ bula nke obi-ya nēme ya ka ọ nwe afọ-ofufo ka unu gānara àjà-nbulim.


Ha we bia, onye ọ bula nke obi-ya kwaliri ya, na onye ọ bula nke mọ-ya mere ka o nwe afọ-ofufo, ha we weta àjà-nbuli Jehova, iji je ozi ulo-ikwū nzute ahu, na iji fè òfùfè-ya nile, na iji me uwe nsọ ahu.


Nwoke ọ bula na nwayi ọ bula, ndi obi-ha mere ka ha nwe afọ-ofufo iweta ihe iji je ozi nile, nke Jehova nyere iwu ka eme n'aka Moses, umu Israel ahu wetara onyinye afọ-ofufo nye Jehova.


ha we si n'iru Moses were ihe àjà-nbuli ahu nile nke umu Israel wetara iji je ozi nke òfùfè nke ebe nsọ ahu, ime ya. Ma ndi Israel ahu nọ n'iwetara ya onyinye-afọ-ofufo kwa-ututu.


N'ihi na asi na obi di ọku di ya, ọ bu ihe agānara nke-ọma dika ihe ọ bula madu nwere si di, ọ bughi dika ihe ọ nēnweghi.


N'ihi na ka ike-ha ra, dika m'nāb͕a àmà, e, kari kwa ike-ha, ka ha nyere dika ha zuputara n'onwe-ha,


Ka onye ọ bula n'etiti unu nye dika o buru uzọ rọputa n'obi-ya; ọ bughi site na nwuta, ma-ọbu site na nkpà: n'ihi na Chineke huru onye were obi-utọ nēnye n'anya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan