Ndia bu kwa ndi nārigo site na Tel-mela na Tel-hasha na Kerub na Adan na Imea: ma ha apughi igosi ulo nke ndi bu nna-ha, na nkpuru-ha, ma ọ bu Israel ka ha siri puta:
Site kwa n'umu ndi-nchu-àjà: umu Habaia, na umu Hakoz, na umu Bazilai, onye luru nwunye sitere n'umu-ndinyom Bazilai, bú onye Gilead, ewe kpọ ya aha n'aha-ha.