Ufọdu nime umu Israel na nime ndi-nchu-àjà na ndi Livai na ndi-ọbù-abù na ndi-ọnu-uzọ-ama na Netinim we rigorue Jerusalem n'arọ nke-asa nke Ataksakses, bú eze.
M'we nye ha iwu inye Ido, bú onye-isi na Kasifia, bú ebe ahu; m'we tiye n'ọnu-ha okwu igwa Ido, bú nwa-nne-ya, na Netinim, nime Kasifia, bú ebe ahu, ka ha me ka ndi nējere ulo Chineke-ayi ozi biakute ayi.
Ndi-ayi fọduru, na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na ndi-ọnu-uzọ-ama, na ndi-ọbù-abù, na Netinim, na onye ọ bula nke siworo n'etiti ndi iche iche nke ala ọzọ kewapuru iwu Chineke onwe-ya, ha na ndinyom-ha, na umu-ha ndikom, na umu-ha ndiyom, onye ọ bula nke mara ihe, nke nāghọta kwa ihe;
Ma ndia bu ndi-isi ala ahu anāchi achi ndi biri na Jerusalem: ma n'obodo nile nke Juda ka ndi ọzọ biri, nwoke ọ bula n'ihe-onwunwe-ya n'obodo nile ha, bú Israel, na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, na Netinim, na umu ndi-orù Solomon.