Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ezra 10:8 - Bible Nso

8 ka ewezuga kwa àkù-ya nile ibibi ya, kewapu kwa onye ahu na nkpọkọta ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, bú onye ọ bula nke nābiaghi n'ubọchi atọ, dika ndum-ọdu ndi-isi na ndi-okenye si di.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Ndịisi na ndị okenye kpebiri na onye ọbụla nke na-abịaghị nʼụbọchị atọ, dịka atụmatụ ha si dị, na a ga-anara onye ahụ akụ niile o nwere, kewapụkwa onye ahụ site na mkpọkọta ndị Izrel e mere ka ha gaa biri nʼala ọzọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ezra 10:8
14 Iomraidhean Croise  

Ha we kwusa nime Juda na Jerusalem gwa umu nile nke ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ka ha chikọta onwe-ha na Jerusalem;


Ndikom nile nke Juda na Benjamin we chikọta onwe-ha na Jerusalem n'ubọchi atọ; nke ahu bu ọnwa nke-iteghete, n'ubọchi nke-orú n'ọnwa ahu: ndi ahu nile we nọdu n'amá ulo Chineke, nāma jijiji n'ihi okwu a, na site n'oké miri-ozuzo nile.


Ma onye nke nēmeghi iwu Chineke-gi, na iwu eze, ka ewere ngwa ngwa me ya ihe ekpere n'ikpe, ma ọ bu inwu ọnwu, ma-ọbu iwepu ya n'ala, ma-ọbu iri àkù-ya na nra, ma-ọbu ike ya ab͕u.


Ma otù nime umu-ndikom Joiada nwa Elaiashib, bú onye-isi-nchu-àjà, bu di nwa-nwayi Sanbalat onye Horonaim: m'we me ka ọ b͕apu n'ebe m'nọ.


O rue, mb͕e ha nuru iwu ahu, na ha kewapuru ndi nile gwara ọgwa n'Israel.


Nání, ọ dighi ihe ọ bula agēre ma-ọbu b͕aputa, nke ewezugara ka ebibie ya, nke onye ọ bula gēwezugara Jehova ka ebibie ya, site n'ihe nile o nwere, site na madu na anu-ulo, ma-ọbu site n'ala-ubi nke ihe-onwunwe-ya: ihe ọ bula ewezugara ka ebibie ya, ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ buru Jehova.


Ma ọ buru na ọ ṅaghi ha nti, gwa nzukọm: ma ọ buru na ọ ṅaghi kwa nzukọm nti, ka ọ diri gi ka onye mba ozọ na onye-ọna-utu.


Ha gāchupu unu nime ulo-nzukọ: e, oge hour nābia, ka ọ gābu na onye ọ bula nke gēb͕u unu gēchè na ọ nējere Chineke ozi.


Ihe ndia ka ndi muru ya kwuru, n'ihi na ha nātu egwu ndi-Ju: n'ihi na ndi-Ju kwekọrọri n'etiti onwe-ha ub͕u a, ka esi n'ulo-nzukọ chupu onye ọ bula, ma ọ buru na ọ gēkwuputa na Ọ bu Kraist.


Ha zara, si ya, Amuru gi onwe-gi nime nmehie, ọ̀ bu gi onwe-gi nēzí kwa ayi ihe? Ha we chupu ya n'èzí.


ma Chineke nēkpe ndi nọ n'èzí ikpé. Wepunu ajọ onye ahu n'etiti onwe-unu.


Ma ọla-ọcha nile, na ọla-edo, na ihe nile nke ọla na ígwè, nsọ ka ha diri Jehova: ha gābà n'ulo-àkù Jehova.


Umu Israel we si, Ònye nọ n'etiti ebo nile nke Israel nke nārigokuteghi Jehova nime nkpọkọta? N'ihi na ọṅuǹu-iyi uku di bayere onye ahu nke nārigokuteghi Jehova rue Mizpa, si, Aghaghi ime ka ọ nwua.


O we chiri ehi abua, bọkasia ha, zisa ha n'ókè-ala nile nke Israel n'aka ndi-ozi, si, Onye ọ bula nke nāputaghi iso Sọl na iso Samuel n'azu, otú a ka agēme ehi-ya. Oké egwu nke Jehova we dakwasi ndi Israel, ha we puta dika otù nwoke.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan