20 Na n'etiti umu Imea; Hanani na Zebadaia.
20 Ndị si nʼikwu Imea bụ Hanani, na Zebadaya.
nke iri-na-ise putara Bilga, nke-iri-na-isi putara Imea;
Ha we nye aka-ha ime ka ndinyom-ha pua; ebe ikpe mara ha, ha we nye ebulu nke ìgwè aturu n'ihi ikpe-ọmuma-ha.
Na n'etiti umu Harim; Maaseia, na Elaija, na Shemaia, na Jehiel, na Uzaia.
Ndi-nchu-àjà: umu Jedaia, nke ulo Jeshua, nnù abua na ọgu asatọ na iri na atọ.
Umu Imea, nnù abua na ọgu iri-na-abua na iri na abua.
Umu Harim, nnù abua na ọgu iri na iri na asa.
Jeshua nwa Jozadak, na umu-nne-ya, bú ndi-nchu-àjà, na Zerubabel nwa Shealtiel, na umu-nne-ya, we bilie, wue ebe-ichu-àjà Chineke Israel, isure àjà-nsure-ọku n'elu ya, dika edeworo ya n'iwu Moses, bú onye nke Chineke.