Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ezra 1:9 - Bible Nso

9 Nka bu kwa ọnu-ọgugu-ha: orú ọkwa ọla-edo na iri, na nnù ọkwa ọla-ọcha abua na ọgu iri, na orú mma na iteghete;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Nke a bụ ọnụọgụgụ ngwongwo ndị ahụ: efere ọlaedo iri atọ (30), efere ọlaọcha otu puku (1,000), efere ọlaọcha iri abụọ na itoolu (29),

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ezra 1:9
14 Iomraidhean Croise  

na iko nile, na ihe-ikpakepu-ọku nile, na ọkwa-nwusa nile, na ngaji nile, na ihe-igu-ọku nile, ha bu ọla-edo makarisiri nma; na ihe-nkoye-ibo nile, ma nke diri ọnu-uzọ ime-ime ulo ahu, bú ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile, ma nke diri ọnu-uzọ ulo, bú ulo uku Chineke, ha bu ọla-edo.


Ihe-igu-ọku nile kwa, na ọkwa-nwusa nile; ihe nke bu ọla-edo, n'ọla-edo, na ihe nke bu ọla-ọcha, n'ọla-ọcha, onye-isi ndi-ob͕ū chipuru ha.


Mb͕e ha lubìri, ha we weta n'iru eze na Jehoiada ego fọduru, ha we were ya mere ulo Jehova ihe, bú ihe ozi, na isure àjà-nsure-ọku, na ngaji, na ihe ọla-edo na ọla-ọcha. Ha we nēsure àjà-nsure-ọku n'ulo Jehova mb͕e nile ubọchi nile nke Jehoiada.


Huram me-kwa-ra ite nile, na osekè nile, na ọkwa-nwusa nile. Huram we jebìe ozi nke o jere eze, bú Solomon, n'ulo Chineke:


O me kwa table iri, dọba ha n'ulo uku Chineke, ise n'aka-nri, na ise n'aka-ekpe. O me kwa ọgu ọkwa-nwusa ise nke ọla-edo.


orú ọkwa ntà ọla-edo na iri, na nnù ọkwa ntà ọla-ọcha na iri nke-abua di iche, na nnù ihe ọzọ abua na ọgu iri.


m'we tùa nye ha n'aka nnù talent ọla-ọcha na ọgu iri-na-abua na iri, na ọgu talent ihe ọla-ọcha ise; na ọgu talent ọla-edo ise;


na orú ọkwa ntà ọla-edo, ọtùtù-ha bu nnù daric abua na ọgu iri; na ihe abua nke ezi ọla nācha edo edo, bú ihe anāchọsi ike dika ọla-edo.


Ndi-nchu-àjà na ndi Livai we nara ọtùtù nke ọla-ọcha na ọla-edo na ihe ahu nile, ibūru ha biarue Jerusalem rue ulo Chineke-ayi.


onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di; ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma;


Ma ebe nne-ya kwaliri ya, ọ si, Nyem isi Jọn Baptist n'ọkwa n'ebe a.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan