Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ezra 1:1 - Bible Nso

1 Ma n'arọ mbu nke Sairọs, bú eze Peasia, ka okwu Jehova nke sitere n'ọnu Jeremaia we rè, Jehova kpọtere mọ nke Sairọs, bú eze Peasia, o we kwusa n'ala-eze-ya nile, ọzọ kwa, o tiyere ya n'odide-akwukwọ, si,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Nʼafọ mbụ nke ọchịchị Sairọs, eze Peshịa, ime ka okwu Onyenwe anyị nke sitere nʼọnụ Jeremaya mezuo, Onyenwe anyị kpaliri mmụọ Sairọs, eze Peshịa ka o mee mkpọsa nʼalaeze ya niile, ma denyekwa ya nʼakwụkwọ iwu, sị,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ezra 1:1
23 Iomraidhean Croise  

Ndi-isi ulo nke ndi bu nna Juda na Benjamin, na ndi-nchu-àjà, na ndi Livai, bú onye ọ bula Chineke kpọtere mọ-ya, we bilie irigo iwu ulo Jehova nke di na Jerusalem.


Zerubabel na Jeshua na ndi fọduru nke ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke Israel we si ha, Ọ dighi nke ayi na unu nwekọrọ n'iwuru Chineke-ayi ulo; kama ayi onwe-ayi gēwukwara Jehova, bú Chineke Israel, ulo, dika eze, bú Sairọs eze Peasia, nyere ayi iwu.


Ma ndi-okenye nke ndi-Ju nēwu ulo, ihe nāga-kwa-ra ha nke-ọma, site n'ibu-amuma nke Hagai, bú onye-amuma, na Zekaraia nwa Ido. Ha we wue, wuzu kwa ya, site n'ihe Chineke Israel nyere n'iwu, na site n'ihe Sairọs na Daraiọs na Ataksakses, bú eze Peasia, nyere n'iwu.


ha we were ọṅù me ememe achicha ekoghi-eko ubọchi asa: n'ihi na Jehova mere ka ha ṅuria ọṅu, O me-kwa-ra ka obi eze Asiria chigharia n'ebe ha nọ, ime ka aka-ha di ike n'ije-ozi nke ulo Chineke, bú Chineke Israel.


N'arọ mbu nke Sairọs, bú eze, Sairọs, bú eze, nyere iwu; Ulo Chineke nime Jerusalem, ka ewue ulo ahu, bú ebe ha nāchu àjà, ka atọ kwa ntọ-ala-ya si-ike; idi-elu-ya gādi ọgu cubit atọ, obosara-ya ọgu cubit atọ;


Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke nke nna-ayi-hà, bu, Onye tiyeworo ihe di otú a n'obi eze, nime ka ulo Jehova nke di na Jerusalem ma nma;


O we me ha ka enwe obi-ebere nile n'aru ha N'iru ndi nile ndi nādọta ha n'agha.


Iyi di iche iche nke juputara na miri ka obi eze bu n'aka Jehova: N'ebe ọ bula nke nātọ Ya utọ ka Ọ nēwezuga ya.


Onye ahu Nke nēkwu okwu bayere Sairọs, si, Ọ bu onye-ọzùzù-aturum, ihe nile nke nātọm utọ ka ọ gēmezu kwa: ọbuná n'ikwu okwu bayere Jerusalem, si, Agēwu ya; na n'isi ulo uku Chineke, Agātọ ntọ-ala-gi.


Otú a ka Jehova siri onye-Ya etere manu, bú Sairọs, onye M'jideworo aka-nri-ya, izọda mba di iche iche n'iru ya, ọ bu kwa úkwù ndi-eze ka M'gēkepu; imeghe uzọ n'iru ya, agaghi-emechibido kwa ọnu-uzọ-ama;


Okwu Jeremaia nwa Hilkaia, onye sitere na ndi-nchu-àjà ndi nọ n'Anatot n'ala Benjamim:


N'ihi na otú a ka Jehova siri, Mb͕e ọgu arọ atọ na iri ruzuru nye Babilon, M'gēleta unu, me ka ezi okwum ahu guzosiere unu ike, n'ime ka unu lata n'ebe a.


Peasia na Etiopia na Put soro ha; ha nile chiri ọta na okpu-agha:


Daniel we nọgide rue arọ mbu nke Sairọs, bú eze.


Ma n'arọ nke-abua nke ọbubu-eze nke Nebukadneza, Nebukadneza rọrọ nrọ di iche iche; mọ-ya we basasia, ura-ya we gwu n'anya-ya.


Mb͕e ahu Daraiọs, bú eze, degara ndi nile di iche iche, na mba nile, na ndi nāsu asusu nile di iche iche, ndi bi n'uwa nka nile, akwukwọ-ozi, si; Ka udo-unu di uku.


n'arọ mbu nke ọbubu-eze-ya ka mu onwem, bú Daniel, jiri akwukwọ nile ayi ghọta ọnu-ọgugu arọ ahu, nke okwu Jehova ruru Jeremaia, bú onye-amuma, nti bayere ha, imezuru nkpọnkpọ ebe nile nke Jerusalem, bú ọgu arọ atọ na iri.


Ọ siri, Mu onwem bu olu otù onye nēti nkpu n'ọhia, si, Menu uzọ Onye-nwe-ayi ka o guzozie ike, dika Aisaia onye-amuma kwuru.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan