Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Esta 9:4 - Bible Nso

4 N'ihi na Mọdekai di uku n'ulo eze, akukọ-ya we nējezu n'ala nile anāchi achi: n'ihi na nwoke ahu, bú Mọdekai, nāga n'iru n'idi uku.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Nʼihi na Mọdekai bụ onye a ma ama nʼụlọeze, ọ bụkwa onye a maara aha ya nʼalaeze ahụ niile, nʼihi na ike ọchịchị ya na-abawanye ụba karịa ụbọchị niile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Esta 9:4
14 Iomraidhean Croise  

Agha ahu we di ogologo n'etiti ulo Sọl na ulo Devid: ma Devid di ike nāga n'iru, ma ulo Sọl enweghi ike nāla azu azu.


Devid we nāga n'iru, nēje nādi uku; Jehova nke usu nile nke ndi-agha nọye-kwa-ra ya.


Aha Devid we pua jezue n'ala nile; Jehova we tiye ujọ-ya n'aru mba nile.


Ma ọlu nile nke ike-ya na nke idi-ike-ya, na ọkukọ-isi nke idi-uku nke Mọdekai, bú nke eze mere ya ka ọ di uku, èdeghi ihe ndia n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Midia na Peasia?


Ọ gādi kwa ka osisi akuworo n'akuku iyi juputara na miri, Nke nāmi nkpuru-ya na mb͕e-ya, Ọzọ, akwukwọ-ya adighi-akpọnwu; Ihe ọ bula kwa nke ọ nēme, ọ nēme ka ọ ga nke-ọma.


I nēme ka m'b͕apu n'ilu-ọ̀gù nile nke ndim; I nēdom onye-isi mba nile ọzọ Ndi m'nāmaghi gēfèm òfùfè.


Ndi akuworo n'ulo Jehova dika osisi Gāma akwukwọ n'ogige nile nke Chineke-ayi.


Jehova we nye ndi Israel amara n'iru ndi Ijipt. Ọzọ, nwoke ahu, bú Moses, di uku ri nne n'ala Ijipt, n'anya ndi-orù Fero, na n'anya ndi ahu.


Ma okporo-uzọ ndi ezi omume di ka ìhè nēnwu enwu, Nke nāmu aga n'iru n'iru rue mb͕e chi bọchara.


Ọ dighi ọgwugwu ọ bula iba-uba nke ibu-onye-isi-Ya na udo-Ya gāgwu, n'elu oche-eze Devid, na n'elu ala-eze-ya, ime ka o guzosie ike, na ikwagide ya n'ikpé ziri ezi na n'ezi omume, site n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi. Ekworo Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēme nka.


Le, M'ganēmeso ndi ahu nile, bú ndi nēweda gi n'ala, na mb͕e ahu: M'gāzọputa kwa nwanyi ahu nke nēje nsukwara-achi, ọ bu kwa nwanyi nke achupuru achupu ka M'gāchikọta; M'gēme kwa ka ha ghọ otuto, ghọ kwa aha, bú ndi ihere-ha di n'uwa nka nile.


Akukọ Ya we jezue na Siria dum: ha we kutara Ya madu nile aru nādighi nma, ndi ọria di iche iche na nmekpa-aru di iche iche nējisi ike, ndi mọ ọjọ ji, ha na ndi ọnwa nēme ka anya ghara idi ha nma, na ndi akuku-aru-ha nwuru anwu; O we me ka aru di ha ike.


Jehova we nọyere Joshua: akukọ-ya we di n'ala ahu nile.


N'ihi nka, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova, bú Chineke Israel, puta, Ọ bu ezie na M'siri na ulo-gi na ulo nna-gi gējeghari n'irum rue mb͕e ebighi-ebi: ma ub͕u a, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, Ya burum ihe-árú; n'ihi na ndi nāsọpurum ka M'gāsọpuru, ma agākpọ ha ihe efu, bú ndi nēlelìm.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan