Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Esta 9:3 - Bible Nso

3 Ndi-isi nile nke ala nile anāchi achi, na ndi nọchiri anya eze, na ndi nāchi ala, na ndi nēje ozi eze nwere, ha nēye-kwa-ra ndi-Ju aka; n'ihi na oké egwu Mọdekai dakwasiri ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Ndịisi ọchịchị obodo niile, ndị na-anọchite anya eze, na ndịisi, na ndị ozi eze, nyeere ndị Juu aka, nʼihi na ha tụrụ egwu Mọdekai.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Esta 9:3
9 Iomraidhean Croise  

ndi ahu soro Zerubabel bia: bú Jeshua, Nehemaia, Seraia, Reelaia, Mọdekai, Bishan, Mispa, Bigvai, Rehum, Beana. Ọnu-ọgugu ndikom nke ndi Israel:


Ha we nye ndi nọchiri anya eze na ndi nāchi ala n'ofè osimiri iwu nile nke eze: ha we yere ndi-Ju na ulo Chineke aka.


Ewe kpọ ndi-ode-akwukwọ eze n'ọnwa mbu, n'ubọchi nke-iri-na-atọ di nime ya, ewe de ya n'akwukwọ dika ihe nile si di nke Heman nyere ndi nọchiri anya eze n'iwu, nke o nye-kwa-ra ndi nāchi ala ndi bu ndi-isi ala ọ bula anāchi achi, nke o nye-kwa-ra ndi-isi ndi ọ bula; ala ọ bula anāchi achi dika odide-akwukwọ-ya si di, na ndi ọ bula dika asusu-ya si di; n'aha eze, bú Ahasuerọs, ka edere ya, eji-kwa-ra nb͕a-aka-akàrà eze ka ya akàrà.


N'ala nile ọ bula anāchi achi, na n'obodo nile o bula, ebe ọ bula okwu eze na iwu-ya nābiaru, ndi-Ju nwe-kwa-ra ọṅù na obi-utọ na ọṅuṅu-manya-vine na ezi ubọchi. Ọtutu madu nime ndi di iche iche nke ala ahu we nāghọ ndi-Ju; n'ihi na oké egwu ndi-Ju dakwasiri ha.


si, Ọ buru na ọ di eze nma, ọ buru kwa na ahutawom amara n'iru ya, ọ buru kwa na okwu a ziri ezi n'iru eze, ọ buru kwa na mu onwem adi nma n'anya-ya, ka ede ya n'akwukwọ iweghachi akwukwọ, bú èchìchè Heman nwa Hamedata onye Egag, nke o dere ime ka ndi-Ju la n'iyì, bú ndi nọ n'ala nile anāchi achi nke eze.


Ewe kpọ ndi-ode-akwukwọ eze na mb͕e ahu, n'ọnwa nke-atọ, nke ahu bu ọnwa Sivan, n'ubọchi nke-orú-na-atọ nime ya; ewe de ya dika iwu nile si di nke Mọdekai nyere ndi-Ju, nye kwa ndi nọchiri anya eze na ndi nāchi ala na ndi-isi ala nile anāchi achi nke di site n'India we rue Etiopia, bú ọgu ala isi na asa nke anāchi achi, ala ọ bula anāchi achi dika odide-akwukwọ-ya si di, na ndi ọ bula dika asusu-ya si di, nye kwa ndi-Ju dika odide-akwukwọ-ha si di, na dika asusu-ha si di.


Nebukadneza, bú eze, zi-kwa-ra ka achikọta ndi nọchiri anya eze, na ndi-isi, na ndi nāchi achi, na ndi-ikpé, na ndi-odozi-àkù, na ndi-ndum-ọdu, na ndi-odozi-okwu, na ndi nile nāchi ala anāchi achi, ibia n'irara onyinyo ahu nye, bú nke Nebukadneza, bú eze, guzobeworo ọtọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan