Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Esta 9:21 - Bible Nso

21 ime ka o guzosiri ha ike na ha ganēme ememe n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa Ada, na n'ubọchi nke-iri-na-ise nime ya, n'arọ nile ọ bula,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 ka ha na-eme mmemme a kwa afọ nʼụbọchị nke iri na anọ na nke iri na ise nke ọnwa Ada ọbụla.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Esta 9:21
8 Iomraidhean Croise  

Ma n'ubọchi nke-atọ nke ọnwa Ada, nke di n'arọ nke-isi nke ọbubu-eze Daraiọs, bú eze, ka ewuchara ulo a.


N'ọnwa mbu, nke ahu bu ọnwa Nisan, n'arọ nke-iri-na-abua nke eze, bú Ahasuerọs, ka ha fere Pua, nke ahu bu nzà, n'iru Heman, site n'otù ubọchi rue ubọchi ọzọ, site kwa n'otù ọnwa ọzọ, rue ọnwa nke-iri-na-abua, nke ahu bu ọnwa Ada.


N'ubọchi nke-iri-na-atọ n'ọnwa Ada ka ha mere nka; ha we zuru ike n'ubọchi nke-iri-na-anọ nime ya, me ya ubọchi ọṅuṅu-manya-vine na ọṅù.


Ma ndi-Ju ndi nọ na Shushan kpọkọtara onwe-ha n'ubọchi nke-iri-na-atọ nime ya, na n'ubọchi nke-iri-na-anọ nime ya; ha we zuru ike n'ubọchi nke-iri-na-ise nime ya, me ya ubọchi ọṅuṅu-manya-vine na ọṅù.


Mọdekai we de ihe ndia n'akwukwọ, zigara ndi-Ju nile akwukwọ, bú ndi nọ n'ala nile anāchi achi nke eze, bú Ahasuerọs, ma ndi nọ nso ma ndi nọ n'ebe di anya,


dika ubọchi nke ndi-Ju zuru ike nime ha pua n'aka ndi-iro-ha, na ọnwa ahu nke b͕anwere n'ebe ha nọ, isi n'ihe-nwuta ghọ ọṅù, isi kwa n'iru-újú ghọ ezi ubọchi: na ha ganēme ha ubọchi ọṅuṅu-manya-vine na nke ọṅù, na nke izigaritara onwe-ha òkè, na nke inye ndi-ob͕eye onyinye.


n'ihi nka ka ndi-Ju mere ka o guzosie ike, ha we nara ihe a bayere onwe-ha, baye-kwa-ra nkpuru-ha, baye-kwa-ra ndi nile ndi nārapara n'aru-ha, ka o we ghara igabiga, bú na ha ganēme ememe n'ubọchi abua ndia dika odide-akwukwọ-ha si di, na dika mb͕e-ha ezubere ezube si di, n'arọ nile ọ bula;


Esta, bú nwunye eze, nwa-nwayi Abihail, na Mọdekai, bú onye-Ju, we were ike nile de akwukwọ ime ka akwukwọ-ozi a nke-abua nke Purim guzosie ike.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan