Esta 9:20 - Bible Nso20 Mọdekai we de ihe ndia n'akwukwọ, zigara ndi-Ju nile akwukwọ, bú ndi nọ n'ala nile anāchi achi nke eze, bú Ahasuerọs, ma ndi nọ nso ma ndi nọ n'ebe di anya, Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a20 Emesịa, Mọdekai dere ihe ndị a niile nʼakwụkwọ, zigakwara ndị Juu niile nọ nʼokpuru ọchịchị eze Sekses, ma ndị nọ nso ma ndị nọ nʼebe dị anya, Faic an caibideil |
Ewe kpọ ndi-ode-akwukwọ eze n'ọnwa mbu, n'ubọchi nke-iri-na-atọ di nime ya, ewe de ya n'akwukwọ dika ihe nile si di nke Heman nyere ndi nọchiri anya eze n'iwu, nke o nye-kwa-ra ndi nāchi ala ndi bu ndi-isi ala ọ bula anāchi achi, nke o nye-kwa-ra ndi-isi ndi ọ bula; ala ọ bula anāchi achi dika odide-akwukwọ-ya si di, na ndi ọ bula dika asusu-ya si di; n'aha eze, bú Ahasuerọs, ka edere ya, eji-kwa-ra nb͕a-aka-akàrà eze ka ya akàrà.
Ewe kpọ ndi-ode-akwukwọ eze na mb͕e ahu, n'ọnwa nke-atọ, nke ahu bu ọnwa Sivan, n'ubọchi nke-orú-na-atọ nime ya; ewe de ya dika iwu nile si di nke Mọdekai nyere ndi-Ju, nye kwa ndi nọchiri anya eze na ndi nāchi ala na ndi-isi ala nile anāchi achi nke di site n'India we rue Etiopia, bú ọgu ala isi na asa nke anāchi achi, ala ọ bula anāchi achi dika odide-akwukwọ-ya si di, na ndi ọ bula dika asusu-ya si di, nye kwa ndi-Ju dika odide-akwukwọ-ha si di, na dika asusu-ha si di.