Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Esta 9:20 - Bible Nso

20 Mọdekai we de ihe ndia n'akwukwọ, zigara ndi-Ju nile akwukwọ, bú ndi nọ n'ala nile anāchi achi nke eze, bú Ahasuerọs, ma ndi nọ nso ma ndi nọ n'ebe di anya,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 Emesịa, Mọdekai dere ihe ndị a niile nʼakwụkwọ, zigakwara ndị Juu niile nọ nʼokpuru ọchịchị eze Sekses, ma ndị nọ nso ma ndị nọ nʼebe dị anya,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Esta 9:20
16 Iomraidhean Croise  

Chetanu oké ọlu-Ya nile nke Ọ luworo; Ihe-ebube-Ya nile, na ikpé nile nke ọnu-Ya;


O rue, n'ubọchi Ahasuerọs, (nka bu Ahasuerọs nke bu eze ọgu ala anāchi achi na asa, site n'India we rue Etiopia:)


o we ziga akwukwọ n'ala nile anāchi achi nke eze, n'ala ọ bula anāchi achi dika odide-akwukwọ-ya si di, ziga-kwa-ra ndi ọ bula dika asusu-ya si di, na nwoke ọ bula gābu onye-isi n'ulo-ya, na ọ ganēkwu kwa ya dika asusu ndi-ya si di.


Ewe kpọ ndi-ode-akwukwọ eze n'ọnwa mbu, n'ubọchi nke-iri-na-atọ di nime ya, ewe de ya n'akwukwọ dika ihe nile si di nke Heman nyere ndi nọchiri anya eze n'iwu, nke o nye-kwa-ra ndi nāchi ala ndi bu ndi-isi ala ọ bula anāchi achi, nke o nye-kwa-ra ndi-isi ndi ọ bula; ala ọ bula anāchi achi dika odide-akwukwọ-ya si di, na ndi ọ bula dika asusu-ya si di; n'aha eze, bú Ahasuerọs, ka edere ya, eji-kwa-ra nb͕a-aka-akàrà eze ka ya akàrà.


Ewe kpọ ndi-ode-akwukwọ eze na mb͕e ahu, n'ọnwa nke-atọ, nke ahu bu ọnwa Sivan, n'ubọchi nke-orú-na-atọ nime ya; ewe de ya dika iwu nile si di nke Mọdekai nyere ndi-Ju, nye kwa ndi nọchiri anya eze na ndi nāchi ala na ndi-isi ala nile anāchi achi nke di site n'India we rue Etiopia, bú ọgu ala isi na asa nke anāchi achi, ala ọ bula anāchi achi dika odide-akwukwọ-ya si di, na ndi ọ bula dika asusu-ya si di, nye kwa ndi-Ju dika odide-akwukwọ-ha si di, na dika asusu-ha si di.


N'ihi nka ndi-Ju nke obodo nile nēnweghi mb͕idi, bú ndi bi n'obodo nēnweghi mb͕idi, nēme ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa Ada ka ọ buru ubọchi ọṅù na ọṅuṅu-manya-vine, na ezi ubọchi, na ubọchi izigaritara onwe-ha òkè.


ime ka o guzosiri ha ike na ha ganēme ememe n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa Ada, na n'ubọchi nke-iri-na-ise nime ya, n'arọ nile ọ bula,


N'ihi nka ka ha kpọrọ ubọchi ndia Purim, n'aha Pua ahu. N'ihi nka, bú n'ihi okwu nile nke akwukwọ a, na ihe ha huru bayere nka, na ihe biaruru ha aru,


n'ihi nka ka ndi-Ju mere ka o guzosie ike, ha we nara ihe a bayere onwe-ha, baye-kwa-ra nkpuru-ha, baye-kwa-ra ndi nile ndi nārapara n'aru-ha, ka o we ghara igabiga, bú na ha ganēme ememe n'ubọchi abua ndia dika odide-akwukwọ-ha si di, na dika mb͕e-ha ezubere ezube si di, n'arọ nile ọ bula;


Esta, bú nwunye eze, nwa-nwayi Abihail, na Mọdekai, bú onye-Ju, we were ike nile de akwukwọ ime ka akwukwọ-ozi a nke-abua nke Purim guzosie ike.


Jehova we si Moses, De nka n'akwukwọ, ka ọ buru ihe-ncheta, me kwa ka ọ ba na nti Joshua: n'ihi na M'gēhichapusi ncheta Amalek n'okpuru elu-igwe.


Ma ndia bu okwu nke akwukwọ ahu nke Jeremaia, bú onye-amuma, si na Jerusalem zigara ndi-okenye fọduru nime ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, nke o ziga-kwa-ra ndi-nchu-àjà, ziga-kwa-ra ndi-amuma, ziga-kwa-ra ndi Israel nile, ndi Nebukadneza mere ka ha si na Jerusalem je biri na Babilon:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan