Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Esta 9:19 - Bible Nso

19 N'ihi nka ndi-Ju nke obodo nile nēnweghi mb͕idi, bú ndi bi n'obodo nēnweghi mb͕idi, nēme ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa Ada ka ọ buru ubọchi ọṅù na ọṅuṅu-manya-vine, na ezi ubọchi, na ubọchi izigaritara onwe-ha òkè.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 Ọ bụ nke a mere ndị Juu niile bi nʼime ime obodo ji eme mmemme ọṅụ na nke oriri na ọṅụṅụ nʼabalị iri na anọ nke ọnwa iri na abụọ nke afọ ọbụla. Ha mere ụbọchị ahụ ka ọ bụrụkwa ụbọchị inyerịta onyinye.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Esta 9:19
13 Iomraidhean Croise  

N'ala nile ọ bula anāchi achi, na n'obodo nile o bula, ebe ọ bula okwu eze na iwu-ya nābiaru, ndi-Ju nwe-kwa-ra ọṅù na obi-utọ na ọṅuṅu-manya-vine na ezi ubọchi. Ọtutu madu nime ndi di iche iche nke ala ahu we nāghọ ndi-Ju; n'ihi na oké egwu ndi-Ju dakwasiri ha.


Mọdekai we de ihe ndia n'akwukwọ, zigara ndi-Ju nile akwukwọ, bú ndi nọ n'ala nile anāchi achi nke eze, bú Ahasuerọs, ma ndi nọ nso ma ndi nọ n'ebe di anya,


dika ubọchi nke ndi-Ju zuru ike nime ha pua n'aka ndi-iro-ha, na ọnwa ahu nke b͕anwere n'ebe ha nọ, isi n'ihe-nwuta ghọ ọṅù, isi kwa n'iru-újú ghọ ezi ubọchi: na ha ganēme ha ubọchi ọṅuṅu-manya-vine na nke ọṅù, na nke izigaritara onwe-ha òkè, na nke inye ndi-ob͕eye onyinye.


si ya, B͕a ọsọ, gwa nwa-okorọbia nka okwu, si, N'obodo di iche iche nēnweghi mb͕idi ka Jerusalem gēbi, site n'iba-uba madu na anumanu di nime ya.


Otú ọ di, werenu ihe di nime lua ọlu ebere; ihe nile di kwa ọcha n'ebe unu nọ.


Mb͕e ob͕eye di n'etiti gi, bú otù onye n'etiti umu-nne-gi, n'otù nime ọnu-uzọ-ama-gi nile n'ala-gi nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, ab͕ala obi-gi ume, akwukwubala aka-gi n'ebe nwa-nne-gi, bú ob͕eye, nọ:


i gāṅuri kwa ọṅu n'iru Jehova, bú Chineke-gi, gi onwe-gi, na nwa-gi nwoke, na nwa-gi nwayi, na orù-gi nwoke, na orù-gi nwayi, na onye Livai nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, na ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwayi di-ya nwuru, ndi nọ n'etiti gi, n'ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa ime ka aha-Ya biri n'ebe ahu.


i gāṅuri kwa ọṅu n'ememe-gi, gi onwe-gi, na nwa-gi nwoke, na nwa-gi nwayi, na orù-gi nwoke, na orù-gi nwayi, na onye Livai, na ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwayi di-ya nwuru, ndi nọ n'ọnu-uzọ-ama-gi nile.


Ndia nile bu obodo eji mb͕idi di elu, na ọnu-uzọ-ama, na nkpọrọ, wusi ike; nāgughi obodo nēnweghi mb͕idi, ha bara uba nke-uku.


Ndi bi n'elu uwa nāṅuri kwa ọṅu n'isi ha, obi nātọ kwa ha utọ; ha gēzigarita kwa onwe-ha onyinye; n'ihi na ndi-amuma abua ndia mekpara ndi bi n'elu uwa aru.


Jua umu-okorọbia-gi, ha gēgosi kwa gi: ka umu-okorọbia huta kwa amara n'iru gi; n'ihi na ọ bu n'ezi ubọchi ka ayi biaworo: biko, nye ndi-orù-gi, nye kwa nwa-gi Devid, ihe aka-gi gāchọta.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan