Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Esta 9:18 - Bible Nso

18 Ma ndi-Ju ndi nọ na Shushan kpọkọtara onwe-ha n'ubọchi nke-iri-na-atọ nime ya, na n'ubọchi nke-iri-na-anọ nime ya; ha we zuru ike n'ubọchi nke-iri-na-ise nime ya, me ya ubọchi ọṅuṅu-manya-vine na ọṅù.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Ma ndị Juu nọ na Susa zukọtara nʼụbọchị nke iri na atọ, na nʼụbọchị nke iri na anọ. Emesịa, nʼụbọchị nke iri na ise ha zuru ike, mekwa ya ụbọchị ọṅụ na nke oriri na ọṅụṅụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Esta 9:18
7 Iomraidhean Croise  

bú akwukwọ nke eze kwere nime ha ka ndi-Ju ndi nọ n'obodo nile ọ bula kpọkọta onwe-ha, guzo kwa n'ihi ndu-ha, ikpochapu, na ib͕u, na ime ka ha la n'iyì, bú usu-ndi-agha nile nke ndi ahu na ala ahu anāchi achi ndi nākpab͕u ha, ma umu-ntakiri-ha, ma ndinyom-ha, na iluta ihe-nkwata-ha n'agha,


Ma n'ọnwa nke-iri-na-abua, nke ahu bu ọnwa Ada, n'ubọchi nke-iri-na-atọ nime ya, mb͕e okwu eze na iwu-ya biaruru nso ka eme ya, n'ubọchi mb͕e ndi-iro ndi-Ju lere anya ibu ndi-isi-ha; ma ab͕anwere ya, ndi-Ju onwe-ha we ghọ ndi-isi nke ndi nākpọ ha asì;


N'ubọchi ahu ọnu-ọgugu ndi eb͕uru eb͕u na Shushan, bú ulo uku eze, biaruru n'iru eze.


Esta we si, Ọ buru na ọ di eze nma, ka enye kwa ndi-Ju ike echi, bú ndi nọ na Shushan, ime dika iwu ta si di, ka akwuba kwa umu-ndikom iri Heman n'elu osisi.


Ndi-Ju ndi nọ na Shushan we kpọkọta kwa onwe-ha n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa Ada, b͕ue ọgu ndikom iri-na-ise nime Shushan; ma ha esetighi aka-ha n'ihe-nluta-n'agha-ha.


ndi-Ju kpọkọtara onwe-ha n'obodo nile ha n'ala nile anāchi achi nke eze, bú Ahasuerọs, iseti aka megide ndi nāchọ ọdi-njọ-ha: ọ dighi kwa nwoke ọ bula guzoro n'iru ha; n'ihi na oké egwu-ha dakwasiri ndi nile di iche iche.


ime ka o guzosiri ha ike na ha ganēme ememe n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa Ada, na n'ubọchi nke-iri-na-ise nime ya, n'arọ nile ọ bula,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan