Eze we si Esta, bú nwunye eze, Nime Shushan, bú ulo uku eze, ka ndi-Ju b͕uworo nnù ndikom na ọgu ise, na umu-ndikom iri Heman, me ka ha la n'iyì; gini kwa ka ha meworo n'ala anāchi achi nke fọduru nke eze? Ma gini bu aririọ-gi? agēnye kwa gi ya: gini bu kwa ọchichọ-gi ọzọ? agēme kwa ya.
Ma ndi-Ju ndi nọ na Shushan kpọkọtara onwe-ha n'ubọchi nke-iri-na-atọ nime ya, na n'ubọchi nke-iri-na-anọ nime ya; ha we zuru ike n'ubọchi nke-iri-na-ise nime ya, me ya ubọchi ọṅuṅu-manya-vine na ọṅù.
M'we hu n'ọhù ahu; o we rue, mb͕e m'nāhu, na mu onwem nọ na Shushan, bú ulo uku eze nke di n'Ilam, bú ala anāchi achi; m'we hu n'ọhù ahu, ma le, mu onwem nọ n'akuku osimiri Ulai.