Esta 8:5 - Bible Nso5 si, Ọ buru na ọ di eze nma, ọ buru kwa na ahutawom amara n'iru ya, ọ buru kwa na okwu a ziri ezi n'iru eze, ọ buru kwa na mu onwem adi nma n'anya-ya, ka ede ya n'akwukwọ iweghachi akwukwọ, bú èchìchè Heman nwa Hamedata onye Egag, nke o dere ime ka ndi-Ju la n'iyì, bú ndi nọ n'ala nile anāchi achi nke eze. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a5 ọ sịrị, “Ọ bụrụ na ọ dị eze mma, ọ bụrụkwa na m hụtara amara nʼihu ya, bụrụkwa ihe ziri ezi nʼanya eze, ọ bụrụkwa na ihe m masịrị ya, ka ede iwu nʼakwụkwọ ịkagbu ozi Heman nwa Hamedata, onye Agag, nke o chepụtara dee ime ka a laa ndị Juu nʼiyi nʼala niile eze na-achị. Faic an caibideil |