Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Esta 7:3 - Bible Nso

3 Esta, bú nwunye eze we za, si, Ọ buru na ahutawom amara n'iru gi, eze, ọ buru kwa na ọ di eze nma, ka enyem ndum n'aririọm, na ndim n'ọchichọm:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Nʼikpeazụ, Esta nwunye eze zara sị, “Eze biko, ọ bụrụ na m ahụtala amara nʼihu gị, ọ bụrụkwa na ọ masịrị gị, zọpụta ndụ m na ndụ ndị m.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Esta 7:3
9 Iomraidhean Croise  

Ndi-orù-ya we si ya, Biko, le, ayi anuwo na ndi-eze ulo Israel, na eze ebere ka ha bu: biko, ka ayi ke ákwà-nkpe n'úkwù-ayi, na udọ̀ n'isi-ayi, pukuru eze Israel: eleghi anya ọ gēdebe gi ndu.


Ọ we ziga kwa onye-isi ọgu ndi-agha abua na iri nke-atọ, ya na ọgu ndi-agha abua na iri ya. Onye-isi nke-atọ nke ọgu ndi-agha abua na iri we rigo, bia b͕ue ikperè-ya n'ala n'iru Elaija, riọ ya amara, si ya, Onye nke Chineke, biko, ka ndum, na ndu ọgu ndi-orù-gi abua na iri ndia, di oké ọnu-ahia n'anya-gi.


Ọzọ, ndeputa odide-akwukwọ iwu ahu nke enyere nime Shushan ikpochapu ha, o nyere ya ya, ime ka Esta hu ya, na igosi ya; na inye ya iwu ibakuru eze, iriọ ya aririọ-amara, na ichọrọ ndi-ya ihe n'iru ya.


ọ buru na ahutawom amara n'iru eze, ọ buru kwa na ọ di eze nma inye ihe m'nāriọ, na ime ihe m'nāchọ, ka eze na Heman bia n'ọṅuṅu-manya-vine nke m'gēmere ha, echi ka m'gēme kwa dika okwu eze si di.


Eze we si n'ọṅuṅu manya-vine bilie n'ọnuma-ya je n'ubi ab͕ara ogige nke ulo-ya: ma Heman guzoro ichọ ndu-ya n'aka Esta, bú nwunye eze; n'ihi na ọ huru na eze zubesiri ihe ọjọ ike megide ya.


si, Ọ buru na ọ di eze nma, ọ buru kwa na ahutawom amara n'iru ya, ọ buru kwa na okwu a ziri ezi n'iru eze, ọ buru kwa na mu onwem adi nma n'anya-ya, ka ede ya n'akwukwọ iweghachi akwukwọ, bú èchìchè Heman nwa Hamedata onye Egag, nke o dere ime ka ndi-Ju la n'iyì, bú ndi nọ n'ala nile anāchi achi nke eze.


Setan we za Jehova, si, Akpukpọ-aru lara akpukpọ-aru, ọbuná ihe nile nke madu nwere ka ọ gēnye n'ọnọdu ndu-ya.


i gāsi kwa ha, Mu onwem nēme ka aririọ-amaram da n'iru eze, ka ọ ghara ime ka m'laghachi n'ulo Jonatan, inwu n'ebe ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan