Ndi-ọb͕a-ọsọ puru, ebe ewere okwu eze me ka ha me ngwa, enye-kwa-ra iwu ahu nime Shushan, bú ulo uku eze: ma eze na Heman nọduru iṅu ihe-ọṅuṅu; ma ọ b͕ara obodo ahu, bú Shushan, ghari.
ọ buru na ahutawom amara n'iru eze, ọ buru kwa na ọ di eze nma inye ihe m'nāriọ, na ime ihe m'nāchọ, ka eze na Heman bia n'ọṅuṅu-manya-vine nke m'gēmere ha, echi ka m'gēme kwa dika okwu eze si di.
Eze we si kwa Esta n'ubọchi nke-abua, n'ọṅuṅu manya-vine ahu, Gini bu aririọ-gi, Esta, nwunye eze? agēnye kwa gi ya: gini bu kwa ọchichọ-gi? rue nkera ala-eze ka agēme kwa ya.