Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Esta 6:11 - Bible Nso

11 Heman we chiri uwe ahu na inyinya ahu, yikwasi Mọdekai, me ka inyinya būru ya ga n'amá obodo, ọ kpọ-kwa-ra n'iru ya, si, Otú a ka agēmere nwoke ahu nke nsọpuru-ya tọworo eze utọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Ya mere, Heman chịịrị uwe eze ahụ yikwasị ya Mọdekai nʼahụ. O mekwara ka ọ nọdụ nʼelu ịnyịnya eze. Emesịa, o duuru ya jegharịa nʼakụkụ obodo ahụ niile na-eti mkpu na-asị, “Otu a ka eze ga-esi sọpụrụ nwoke ahụ ihe ya dị ya mma.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Esta 6:11
9 Iomraidhean Croise  

Mb͕e ahu Tatenai, bú onye nāchi ala n'ofè osimiri, na Sheta-bozenai, na ndi-òtù-ha, dika ozi ahu si di nke Daraiọs, bú eze, ziri, otú a ka ha were ngwa ngwa me.


Eze we si Heman, Me ngwa, chiri uwe ahu na inyinya ahu, dika i si kwu, me-kwa-ra Mọdekai otú a, bú onye-Ju, nke nānọdu n'ọnu-uzọ-ama eze: ka okwu ọ bula ghara idapu n'ihe nile nke i kwuworo.


Mọdekai we laghachi n'ọnu-uzọ-ama eze. Ma Heman were ngwa la n'ulo-ya, nēru újú, ekpuchi-kwa-ra isi-ya.


Mọdekai we si n'iru eze pua n'uwe ala-eze nke ákwà anunu na ezi ákwà ọcha, ya na okpu-eze ọla-edo di uku, na uwe-nwuda nke ezi ákwà ọcha na ákwà ododo: obodo Shushan we tie nkpu ṅuri kwa ọṅu.


Ndi-isi nile nke ala nile anāchi achi, na ndi nọchiri anya eze, na ndi nāchi ala, na ndi nēje ozi eze nwere, ha nēye-kwa-ra ndi-Ju aka; n'ihi na oké egwu Mọdekai dakwasiri ha.


Onye nēche osisi fig gēri nkpuru-ya; Ọ bu kwa onye nāriba onye-nwe-ya ama ka agāsọpuru.


Ọzọ, umu nke ndi nēweda gi n'ala gējekuru gi nēruda n'ala; ndi nile nke nēlelì gi anya gākpọ kwa isi ala n'ọbu-ukwu nke ukwu-gi abua; ha gākpọ kwa gi, Obodo Jehova, Zaion nke Onye Nsọ nke Israel.


O wedawo ndi di ike pua n'oche-eze-ha, Weli kwa elu ndi ọnọdu-ha di ala.


Le, anamenye ufọdu nime ulo-nzukọ, ahu nke Setan, nime ndi si na ha bu ndi-Ju, ma ha abughi, kama ha nēkwu okwu-ugha; le, M'gēme ka ha bia kpọ isi ala n'iru ukwu-gi, ka ha mara kwa na Mu onwem huru gi n'anya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan