Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Esta 4:16 - Bible Nso

16 Je, chikọta ndi-Ju nile ndi aganāchọta nime Shushan, nēbu-kwa-ranum ọnu, unu eri-kwa-la ihe, aṅu-kwa-la ihe-ọṅuṅu ubọchi atọ, abali na ehihie: mu onwem na umu-ab͕ọghọm gēbu kwa ọnu otú a; ma n'uzọ di otú a ka m'gābakuru eze, nke nādighi ka iwu si di: ma asi na alawom n'iyì, alawom n'iyì.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 “Gaa kpọkọtaa ndị Juu niile bi na Susa, bukwaaranụ m ọnụ. Unu erila ihe ọbụla, maọbụ ṅụọ ihe ọbụla abalị atọ, ehihie na abalị. Mụ onwe m kwa, na ụmụ agbọghọ na-ejere m ozi, ga-emekwa otu ihe ahụ. Emesịa, ọ bụ ezie na ọ bụ ihe megidere iwu, ma aga m aga hụ eze anya. Ihe ọ pụtara ya pụta. Ọ pụtara m ọnwụ, ka m nwụọ!”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Esta 4:16
29 Iomraidhean Croise  

N'ihi na amawom ya, ka o we nye umu-ya na ulo-ya, ndi gānọchi ya, iwu, ka ha we debe uzọ Jehova, ime ezi omume na ihe ekpere n'ikpe; ka Jehova we weta n'isi Abraham ihe O kwuru bayere ya.


Chineke Nke puru ime ihe nile, Ya nye kwa unu obi-ebere n'iru nwoke ahu, ka ọ we zitere unu nwa-nne-unu nke-ọzọ na Benjamin. Ma mu onwem, ọ buru na ab͕abaram aka umu, ab͕abawom aka umu.


Di ike, ka ayi me kwa onwe-ayi ndi di ike n'ihi ndi-ayi, na n'ihi obodo nile nke Chineke-ayi: Jehova me kwa ihe di nma n'anya-Ya.


Ọ buru na ayi asi, Ayi gābà n'obodo, oké unwu di kwa n'obodo, ayi gānwu kwa n'ebe ahu: ọ buru kwa na ayi anọdu n'ebe a, ayi gānwu kwa. Ma ub͕u a, bianu, ka ayi dabà n'ọmuma-ulo-ikwū Siria: ọ buru na ha edebe ayi ndu, ayi gādi ndu; ọ buru kwa na ha eme ka ayi nwua, ayi gānwu kwa.


Jehoshafat we tua egwu, che iru-ya ichọ Jehova; o we kpọsa obubu-ọnu na Juda nile.


M'we kpọsa obubu-ọnu n'ebe ahu, n'akuku osimiri Ahava, iweda onwe-ayi n'ala n'iru Chineke-ayi ichọta n'aka-Ya uzọ ziri ezi nye onwe-ayi, nye kwa umu-ntakiri-ayi, nye kwa àkù-ayi nile.


Esta we si ha zaghachi Mọdekai okwu, si,


Mọdekai we gabiga, me dika ihe nile si di nke Esta nyere ya n'iwu.


Ọzọ, n'ala nile ọ bula anāchi achi, ebe ọ bula okwu eze na iwu-ya nābiaru, oké iru-újú ndi-Ju, na obubu-ọnu, na ikwa-ákwá, na iti-aka-n'obi; atusa-kwa-ra ákwà-nkpe na ntu n'okpuru ọtutu madu.


O rue, n'ubọchi nke-atọ, na Esta yiri uwe ala-eze ya, we guzo n'ogige di ime-ime nke ulo eze, na ncherita-iru ulo eze: ma eze nānọkwasi n'oche-eze ala-eze ya n'ulo ala-eze ya, na ncherita-iru ọnu-uzọ ulo ahu.


ime ka ubọchi ndia nke Purim guzosie ike nime mb͕e-ha ezubere ezube, dika Mọdekai, bú onye-Ju, na Esta, bú nwunye eze, mere ka ha guzosiere ha ike, na dika ha mere ka ha guzosiere onwe-ha, guzosi-kwa-ra nkpuru-ha, ike, bú okwu obubu-ọnu na ikwa-ákwá-ha.


Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, we kpọsa ikwa ákwá, na iti aka n'obi n'újú, na ime isi-nkwọcha, na ike ákwà-nkpe n'úkwù n'ubọchi ahu:


O rue, n'arọ nke-ise nke Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda, n'ọnwa nke-iteghete, na ndi nile ndi nọ na Jerusalem, na ndi nile ndi si n'obodo nile nke Juda abata na Jerusalem, kpọsara obubu-ọnu n'iru Jehova.


ka ha we riọ obi-ebere nile n'aka Chineke nke elu-igwe bayere ihe-nzuzo ahu; ka Daniel na ndi-ibe-ya we ghara isoro ndi-amam-ihe Babilon fọduru la n'iyì.


n'ihi na dika Jona nọrọ ubọchi atọ ehihie na abali n'afọ oké anu miri; otú a Nwa nke madu gānọ n'obi nke ala ubọchi atọ ehihie na abali.


N'ihi na onye ọ bula nke nāchọ izọpuita ndu-ya, ọ gētufu ya; ma onye ọ bula nke gētufu ndu-ya n'ihim, onye ahu gāzọputa ya.


Pailat zara, si, Ihe m'deworo, edewom ya.


Ma mb͕e mọ-ozi ahu nke gwara ya okwu lasiri, ọ kpọ madu abua nime ndi nējere ya ozi, na otù onye-agha nke nāsọpuru Chineke nime ndi nānọgide ya nso mb͕e nile;


Ma akpọghm ndum ihe, dika ihe oké ọnu-ahia n'ebe mu onwem nọ, ka m'we b͕azue ọsọm, jezu kwa ozi nke m'natara n'aka Onye-nwe-ayi Jisus, ikwusi ozi ọma ahu ike, bú nke amara nke Chineke.


Mb͕e ahu Pọl zara, si, Gini ka unu nēme, ebe unu nākwa ákwá nētiwa kwa obim? n'ihi na edoziwo mu onwem ọ bughi nání ka ewe kem ab͕u, kama inwu kwa ọnwu na Jerusalem n'ihi aha Onye-nwe-ayi Jisus.


Mb͕e chi gaje ibọ, Pọl we riọ ha nile ka ha rie nri, si Ta mere ya ubọchi nke-iri-na-anọ unu nēle anya, nọgide kwa n'ibū ọnu, ebe unu nērighi ihe.


Ọ hughi kwa uzọ ubọchi atọ, ọ dighi kwa ihe ọ nēri ma-ọbu nke ọ nāṅu.


madu ndi tọb͕ọrọ olu nke aka ha n'ihi ndum; ndi ọ bughi nání mu onwem nēkele, kama nzukọ Kraist nile nke ndi mba ọzọ kwa:


n'ihi na ọ bu n'ihi ọlu Kraist ka ọ biaruru ọnwu nso, nēkwere itufu ndu-ya, ka o we mezu ihe fọduru unu ime n'ifè-òfùfè-unu n'ebe m'nọ.


Ma ọ buru na ọ jọ njọ n'anya-unu ifè Jehova òfùfè, rọputaranu onwe-unu ta onye unu gēfè òfùfè; ma ọ bu chi nile nke nna-unu-hà fère òfùfè nke di n'ofè Osimiri ahu, ma-ọbu chi nile nke ndi-Amorait, ndi unu onwe-unu bi n'ala-ha: ma mu onwem na ulom, ayi gēfè Jehova òfùfè.


n'ihi na o tiyere ndu-ya n'ọbu-aka-ya, tib͕ue onye Filistia ahu, Jehova we zọputa nzọputa uku bayere Israel nile: i huru ya anya, we ṅuria ọṅu: n'ìhi gini kwa ka i gēmehie megide ọbara nēmeghi ihe ọjọ, ime ka Devid nwua n'efu?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan