Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Esta 3:2 - Bible Nso

2 Ndi-orù nile nke eze, ndi nọ n'ọnu-uzọ-ama eze, we nēruru ala, nākpọ kwa isi ala nye Heman: n'ihi na otú a ka eze nyere iwu bayere ya. Ma Mọdekai adighi-eruru ala, ọ dighi-akpọ kwa isi ala nye ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Ndịisi ọchịchị eze niile na-egbu ikpere nʼala nye Heman nsọpụrụ mgbe ọbụla o si nʼọnụ ụzọ ama ụlọeze na-agafe, nʼihi na ọ bụ otu a ka eze nyere nʼiwu. Ma Mọdekai ekweghị egbu ikpere nye ya, ọ kwekwaghị enye ya nsọpụrụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Esta 3:2
15 Iomraidhean Croise  

me ka o were ub͕ọ-ala nke-abua o nwere nāga-ghari; ha we kpọ nkpu n'iru ya, si, B͕u ikpere n'ala: o we do ya onye-isi ala Ijipt nile.


Ma mb͕e achikọtara ha nke ub͕ò abua, bú umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, Mọdekai we nānọdu n'ọnu-uzọ-ama eze.


Na mb͕e ahu, mb͕e Mọdekai nānọdu n'ọnu-uzọ-ama eze, Bigtan na Teresh, bú ndi-nchedo abua nke eze, nime ndi nēche nbata-uzọ, were iwe, chọ iseti aka megide eze, bú Ahasuerọs.


Otù nwoke, bú onye-Ju, nọ na Shushan, bú ulo uku eze, aha-ya bu Mọdekai, nwa Jaia, nwa Shimai, nwa Kish, bú onye Benjamin;


Mb͕e ihe ndia gasiri, eze, bú Ahasuerọs, mere Heman nwa Hamedata, bú onye Egag, ka ọ buru onye oku, o we bulie ya elu, do oche-eze-ya n'ebe di elu kari ndi-isi nile ya na ha nọ.


Ndi-orù eze, ndi nọ n'ọnu-uzọ-ama eze, we si Mọdekai, Gini mere gi onwe-gi nāgabiga ihe eze nyere n'iwu?


Heman we hu na Mọdekai adighi-eruru ala, na ọ dighi-akpọ kwa isi ala nye ya, Heman we juputa n'ọnuma.


Heman we pua ubọchi ahu nāṅuri ọṅu, ọ di kwa ya nma n'obi: ma mb͕e Heman huru Mọdekai n'ọnu-uzọ-ama eze, na o bilighi, na ọ maghi kwa jijiji n'iru ya, Heman juputara n'ọnuma megide Mọdekai.


Eledawo onye ajuru aju anya n'anya-ya, Ma ndi nātu egwu Jehova ka ọ nā-asọputu. Ọ ṅuwo iyi nke gēmejọ ya onwe-ya, ma ọ dighi-ab͕anwe okwu-ya.


Jehova we si Moses, De nka n'akwukwọ, ka ọ buru ihe-ncheta, me kwa ka ọ ba na nti Joshua: n'ihi na M'gēhichapusi ncheta Amalek n'okpuru elu-igwe.


ọ si, Aka dikwasi oche-eze Ja, agha ka Jehova gēbuso Amalek site n'ọb͕ọ rue ọb͕ọ.


Daniel we riọ eze, o we do Shedrak na Mishak na Abed-nego ndi-isi ọlu nke ala ahu anāchi achi, bú Babilon: ma Daniel nọ n'ọnu-uzọ-ama eze.


O gēru kwa, mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gēmewori ka i pua n'aka ndi-iro-gi buruburu, zuru ike, n'ala nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi n'ihe-nketa, ka i we nweta ya, na i gēhichapu ncheta Amalek n'okpuru elu-igwe; echezọla.


ka ọ gābu n'aha Jisus ka ikperè nile we b͕ue n'ala, nke ihe nile di n'elu-igwe na ihe nile di n'elu uwa na ihe nile di n'okpuru ala,


Ub͕u a je tib͕ue Amalek, wezuga ihe nile ọ bula o nwere ka ebibie ya, enwe-kwa-la ọmiko n'aru ya; kama me ka ha nwua, ma nwoke ma nwayi, ma nwatakiri ma nwa nāṅu ara, ma ehi ma aturu, ma camel ma inyinya-ibu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan