Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Esta 3:13 - Bible Nso

13 Ewe site n'aka ndi-ọb͕a-ọsọ ziga akwukwọ n'ala nile anāchi achi nke eze, ikpochapu, na ib͕u, na ime ka ndi-Ju nile la n'iyì, site na nwata we rue okenye, ma umu-ntakiri ma ndinyom, n'otù ubọchi, n'ubọchi nke-iri-na-atọ nke ọnwa nke-iri-na-abua, nke ahu bu ọnwa Ada, na iluta ihe-nkwata-ha n'agha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 E zipụrụ ndị ọgba ọsọ ozi eze ka ha gaa nʼisi obodo ọbụla nʼalaeze ahụ, na-enye iwu a edere nʼakwụkwọ ka a laa nʼiyi, gbuo, ma kpochapụkwa ndị Juu niile, ma nwantakịrị ma okenye, ma nwanyị, ma ụmụntakịrị, nʼotu ụbọchị, nʼabalị iri na atọ nke ọnwa iri na abụọ, nke bụ ọnwa Aada, nakwa ịpụnara ha akụnụba ha nʼike.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Esta 3:13
14 Iomraidhean Croise  

Ndi-ọb͕a-ọsọ we were akwukwọ-ozi sitere n'aka eze na ndi-isi-ya jeghari n'Israel na Juda nile, na dika ihe eze nyere n'iwu si di, si, Umu Israel, laghachikutenu Jehova, bú Chineke Abraham na Aisak na Israel, ka O we laghachikuru ndi b͕apuru ab͕apu ndi fọduru unu site n'aka ndi-eze Asiria.


n'ihi na erewo ayi, bú mu onwem na ndim, ikpochapu ayi, na ib͕u ayi, na ime ka ayi la n'iyì. Ma asi na erewo ayi ibu ndi-orù-ndikom na ibu ndinyom nēje ozi, m'gāb͕a nkiti, ọ bu ezie na onye-nkpab͕u agaghi-emezu n'ihe gēfunari eze.


si, Ọ buru na ọ di eze nma, ọ buru kwa na ahutawom amara n'iru ya, ọ buru kwa na okwu a ziri ezi n'iru eze, ọ buru kwa na mu onwem adi nma n'anya-ya, ka ede ya n'akwukwọ iweghachi akwukwọ, bú èchìchè Heman nwa Hamedata onye Egag, nke o dere ime ka ndi-Ju la n'iyì, bú ndi nọ n'ala nile anāchi achi nke eze.


Ma n'ọnwa nke-iri-na-abua, nke ahu bu ọnwa Ada, n'ubọchi nke-iri-na-atọ nime ya, mb͕e okwu eze na iwu-ya biaruru nso ka eme ya, n'ubọchi mb͕e ndi-iro ndi-Ju lere anya ibu ndi-isi-ha; ma ab͕anwere ya, ndi-Ju onwe-ha we ghọ ndi-isi nke ndi nākpọ ha asì;


bú umu-ndikom iri nke Heman nwa Hamedata, bú onye nākpab͕u ndi-Ju; ma ha esetighi aka-ha n'ihe-nluta-n'agha-ha.


Ndi-Ju we were ntib͕u mma-agha na ob͕ub͕u na ila-n'iyì tib͕ue n'etiti ndi-iro-ha nile, me ndi nākpọ ha asì dika ọ tọrọ ha.


Ma ubọchim nile di garagara kari ọb͕a-ọsọ: Ha ab͕alagawo, ha ahughi ezi ihe.


Imegide mba emeruru emeru ka M'nēziga ya, bayere ndi nke nrubiga-ókè-iwem ka M'nēnye kwa ya iwu, ikwata ihe-nkwata n'agha, na iluta ihe-nluta n'agha, na ido ha ihe-nzọtọ dika apiti nke èzí.


Otù ọb͕a-ọsọ gāb͕a ọsọ izute ọb͕a-ọsọ-ibe-ya, otù onye-ngosi gāb͕a kwa ọsọ izute onye-ngosi-ibe-ya, igosi eze Babilon na ewerewo obodo-ya na nsọtu-ya:


Ukwu-ha di ngwa iwusì ọbara;


N'ihi na ọ bu ikpé nke ebere nādighi ya ka agēkpe onye nēmeghi ebere: ebere nānyara ikpé isi.


Ub͕u a je tib͕ue Amalek, wezuga ihe nile ọ bula o nwere ka ebibie ya, enwe-kwa-la ọmiko n'aru ya; kama me ka ha nwua, ma nwoke ma nwayi, ma nwatakiri ma nwa nāṅu ara, ma ehi ma aturu, ma camel ma inyinya-ibu.


O were kwa ọnu mma-agha tib͕ue Nob, bú obodo ndi-nchu-àjà, were ọnu mma-agha tib͕ue ma nwoke ma nwayi, ma nwatakiri ma nwa nāṅu ara, na ehi na inyinya-ibu na aturu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan