Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Esta 3:1 - Bible Nso

1 Mb͕e ihe ndia gasiri, eze, bú Ahasuerọs, mere Heman nwa Hamedata, bú onye Egag, ka ọ buru onye oku, o we bulie ya elu, do oche-eze-ya n'ebe di elu kari ndi-isi nile ya na ha nọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Mgbe ihe ndị a gasịrị, eze bụ Ahasuerọs mere Heman nwa Hamedata onye Agag ka ọ bụrụ onye ukwu, o nyere ya ugwu site nʼinye ya oche dị elu karịa nke ndị ọzọ niile a na-asọpụrụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Esta 3:1
15 Iomraidhean Croise  

gi onwe-gi gābu onye-isi ulom, ọ bu kwa n'okwu ọnu-gi ka ndim nile gēdo onwe-ha n'usoro: nání n'oche-eze ka m'gādi uku kari gi,


Agu we nāgu ala Ijipt nile, ndi ala ahu we tikue Fero inye ha nri: Fero we si ndi Ijipt nile, Jekurunu Josef, ihe ọ si unu me, menu ya.


N'ihi na anēsi n'iru eze na madu asa ndi nādu ya ọdu ziga gi iwere iwu Chineke-gi nke di n'aka-gi ju ajuju bayere Juda, baye-kwa-ra Jerusalem;


ma onye nọ nso ya bu Kashena, ya na Sheta, na Admata, na Tashish, na Meres, na Masena, na Memukan, bú ndi-isi asa nke Peasia na Midia, ndi nāhu iru eze, ndi nānọ n'isi n'ala-eze:)


Eze we si n'aka-ya wezuga nb͕a-aka-akàrà-ya nye ya Heman nwa Hamedata onye Egag, bú onye nākpab͕u ndi-Ju.


Heman we kọrọ ha akukọ bayere nsọpuru nke àkù-ya, na iba-uba nke umu-ya ndikom, na ihe nile nke eze ji me ka ọ di uku, nke o ji buli kwa ya ibu onye-isi nke ndi-isi na ndi-orù eze.


Esta we si, Otù onye-nkpab͕u na onye-iro, bú Heman ọjọ a. Heman we tua egwu nke-uku n'iru eze na nwunye eze.


Esta we kwu kwa ọzọ n'iru eze, da n'ala n'iru ukwu-ya abua, kwa ákwá, riọ ya aririọ-amara, bú ka o me ka ihe ọjọ Heman, bú onye Egag, na èchìchè-ya nke o chère megide ndi-Ju gabiga.


Ndi nēmebi iwu nējeghari buruburu, Mb͕e anēbuli ihe jọb͕uru onwe-ya elu n'ebe umu madu nọ.


Mb͕e ndi ezi omume nāba uba kari, ndi ala-ha nāṅuri: Ma mb͕e onye nēmebi iwu nāchi achi, ndi ala-ya nēze ume.


etiyere nzuzu n'ebe di iche iche di elu ri nne, ma ndi-ọgaranya nānọdu n'ebe di ala.


na ido ndi-isi atọ ndi-isi-ha, ndi Daniel bu otù nime ha; ka ndi ahu ndi nọchiri anya eze we nākọrọ ha akukọ ihe nile ha nēme, ka o we ghara kwa idi ihe nēfunari eze.


Miri nēsi n'ite-miri-ya nile rùputa, Nkpuru-ya gādi kwa n'ọtutu miri, Eze-ya gādi kwa elu kari Egag, Agēbuli kwa ala-eze-ya.


Samuel we si, Dika mma-agha-gi meworo ndinyom ka ha b͕ara aka nwa, otú a ka nne-gi gāb͕ara aka nwa n'etiti ndinyom. Samuel we b͕ukasia Egag n'iru Jehova nime Gilgal.


Ọ we nwude Egag, bú eze Amalek, na ndu, were ọnu mma-agha wezuga ndi ahu nile ka ebibie ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan