Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Esta 2:9 - Bible Nso

9 Nwa-ab͕ọghọ ahu we di nma n'anya-ya, ewe mere ya ebere n'iru ya; o we me ngwa inye ya ihe-nsacha-ya nile, na òkè-ya nile, na umu-ab͕ọghọ asa ahu ndi eleputaworo n'ulo eze ka enye ya ha: o we wegharia ya na umu-ab͕ọghọ-ya n'ulo kachasi nma nke ndinyom.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Ọ masịrị ya, ọ natakwara ihuọma nʼebe ọ nọ. Ngwangwa ọ malitere inye ya nri pụrụ iche, na ihe ndị ahụ niile e ji edozi ahụ na ịchọ mma. O sitere nʼetiti ụmụ agbọghọ nọ nʼụlọeze họpụta ụmụ agbọghọ asaa ndị na-ejere Esta ozi. O duuru ya na ndị na-ejere ya ozi dubaa nʼebe kachasị mma nʼogige ebe ndị inyom eze bi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Esta 2:9
12 Iomraidhean Croise  

Ma Jehova nọyere Josef, me ka ebere-Ya rue ya aru, O nye ya amara n'iru onye-isi ulo-nkpọrọ ahu.


Josef we huta amara n'iru ya, we jere ya ozi: ọ me ya onye nēlekọta ulo-ya anya, ọ bu kwa ihe nile o nwere ka o tiyere n'aka-ya.


Gi b͕aghara kwa ndi-Gi ndi mehieworo megide Gi, na njehie-ha nile nke ha jehieworo megide Gi; Gi nye kwa ha ka enwe obi-ebere n'aru ha n'iru ndi nādọta ha n'agha, ka ha we nwe obi-ebere n'aru ha:


Ezra nka siri na Babilon rigo; ma onye ahu bu ode-akwukwọ nke bu onye-ọ̀kà n'iwu Moses, nke Jehova, bú Chineke Israel, nyere: eze we nye ya ihe nile ọ riọrọ, dika aka Jehova, bú Chineke-ya, si di n'aru ya.


na akwukwọ-ozi inye Esaf, bú onye nēche ogige ọma nke eze nwere, ka ọ nyem osisi ijikọta ọnu-uzọ-ama nile nke ulo uku ahu n'otù nke diri ulo ahu, na ijikọta mb͕idi obodo n'otù, na ijikọta ulo n'otù, bú nke m'gābà nime ya. Eze we nyem, dika ezi aka Chinekem si di n'arum.


Ma mb͕e orúrú nwa-ab͕ọghọ ọ bula biaruru nso ibakuru eze, bú Ahasuerọs, mb͕e ọnwa iri na abua gwusiri ya, dika iwu ndinyom si di, (n'ihi na otú a ka anēmezu ubọchi nsacha-ha, bú ọnwa isi iji manu myrrh, na ọnwa isi iji uda di iche iche na iji ihe-nsacha ndinyom,)


ka eze me kwa ndi-nlekọta n'ala nile anāchi achi nke ala-eze-ya, ka ha we chikọta umu-ab͕ọghọ nile ndi nāmaghi nwoke, bú ndi di nma ile anya, rue Shushan, bú ulo uku eze, rue ulo ndinyom, rue aka Hege, bú onozi eze, onye nēdebe ndinyom; ka enye kwa ha ihe-nsacha nile ha:


O rue, mb͕e eze huru Esta, bú nwunye eze, ka o nēguzo n'ogige, na ọ natara amara n'anya-ya: eze we setipuru Esta nkpa-n'aka ọla-edo nke di n'aka-ya. Esta we biarue nso, metu isi nkpa-n'aka ahu.


O we me ha ka enwe obi-ebere nile n'aru ha N'iru ndi nile ndi nādọta ha n'agha.


Mb͕e uzọ nile nke onye ọ bula nātọ Jehova utọ, Ọ nēme ọbuná ndi-iro-ya ka ha na ya di n'udo.


Chineke we nye Daniel ka enwe ebere na obi-ebere nile n'aru ya n'iru onye-isi ndi-onozi.


weputa kwa ya na nkpab͕u-ya nile, nye kwa ya amara na amam-ihe n'iru Fero eze Ijipt; o we me ya onye-isi Ijipt na ulo-ya dum.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan