Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Esta 2:23 - Bible Nso

23 Ewe jua ase okwu ahu, chọputa ya, ewe kwuba ha abua n'osisi: ewe de ya n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi ahu n'iru eze.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 Mgbe e nyochara kwu a, chọpụta na ọ bụ eziokwu, e jidere mmadụ abụọ ahụ kwụgbuo ha nʼosisi. E dekwara ihe ndị a niile nʼihu eze nʼime akwụkwọ akụkọ ihe e mere.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Esta 2:23
11 Iomraidhean Croise  

ọ fọduru ubọchi atọ Fero gēweli isi-gi wepu ya n'aru gi, kwuba gi n'elu osisi; anu-ufe gēri kwa anu-aru-gi site n'aru gi.


ma ọ kwubara onye-isi ndi-osi-ite: dika Josef kọrọ isi nrọ nye ha.


ka ewe chọ n'akwukwọ ihe-ncheta nke nna-gi-hà: i we chọta n'akwukwọ ihe-ncheta, mara kwa, na obodo a bu obodo na-enupu isi, nke nēme kwa ka ihe funari ndi-eze na ala nile anāchi achi, na ndi nākpali madu imegide ndi-isi nọ kwa n'etiti ya na mb͕e ochie: ọ bu n'ihi ya ka emere obodo a ka ọ buru nkpọnkpọ-ebe.


Ma ọlu nile nke ike-ya na nke idi-ike-ya, na ọkukọ-isi nke idi-uku nke Mọdekai, bú nke eze mere ya ka ọ di uku, èdeghi ihe ndia n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Midia na Peasia?


Zeresh, bú nwunye-ya, na ndi nile nāhu ya n'anya, we si ya, Ka ha me osisi nke idi-elu-ya di ọgu cubit abua na iri, ma n'ututu gi si eze ka akwuba Mọdekai n'elu-ya: gi so kwa eze ba n'ọṅuṅu-manya-vine ahu nāṅuri ọṅu. Okwu ahu we di nma n'anya Heman; o we me osisi ahu.


N'abali ahu urá eze fepuru n'anya-ya; o we si ka ewebata akwukwọ ihe-ncheta nke ihe emere n'ubọchi ahu, ewe nāgu ha n'iru eze.


Ha we kwuba Heman n'elu osisi nke o doziri nye Mọdekai. Ewe me ka ọnuma eze bìe.


Mḅe ahu ndi nātu egwu Jehova nēkwurita okwu, otú onye na ibe-ya: Jehova we ṅa nti, nu, ewe dere ndi nātu egwu Jehova, ndi nēchè kwa èchìchè aha-Ya, akwukwọ ncheta n'iru Ya.


Ọ we kwuba eze Ai n'osisi rue mb͕e anyasi: ma mb͕e anyanwu nāda Joshua nyere iwu, ha we si n'osisi weda ozu-ya, tuda ya n'oghere ọnu-uzọ-ama obodo, guzo n'elu ya oké obo nkume, rue ta.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan