Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Esta 2:16 - Bible Nso

16 Ewe kuru Esta jekuru eze, bú Ahasuerọs, rue ulo ala-eze ya, n'ọnwa nke-iri, nke ahu bu ọnwa Tebet, n'arọ nke-asa nke ọbubu-eze-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 E mere ka Esta bakwuru eze nʼọnwa nke iri nʼafọ nke asaa nke ọchịchị eze Ahasuerọs.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Esta 2:16
7 Iomraidhean Croise  

Ma n'ọbubu-eze Ahasuerọs, na nmalite ọbubu-eze-ya, ha dere akwukwọ-nmegide imegide ndi bi na Juda na Jerusalem.


O we biarue Jerusalem n'ọnwa nke-ise, nke ahu di n'arọ nke-asa nke eze.


Mb͕e ihe ndia gasiri, mb͕e ọnuma eze, bú Ahasuerọs, bìri, ọ chetara Vashti, na ihe o mere, na ihe ekwubìri megide ya.


Ma mb͕e orúrú Esta, bú nwa-nwayi Abihail nwa-nne nna Mọdekai, onye kuru ya n'onwe-ya ka ọ buru nwa-ya nwayi, biaruru ibakuru eze, ọ chọghi ihe, ọ bu nání ihe Hegai, bú onozi eze, onye nēdebe ndinyom, nāsi ya. Esta we nānata amara n'anya ndi nile nāhu ya anya.


Eze we hu Esta n'anya kari ndinyom ahu nile, o we nata amara na ebere n'iru ya kari umu-ab͕ọghọ ahu nile ndi nāmaghi nwoke; o we tukwasi okpu-eze ala-eze n'isi-ya, me ya nwunye eze n'ọnọdu Vashti.


ka eze me kwa ndi-nlekọta n'ala nile anāchi achi nke ala-eze-ya, ka ha we chikọta umu-ab͕ọghọ nile ndi nāmaghi nwoke, bú ndi di nma ile anya, rue Shushan, bú ulo uku eze, rue ulo ndinyom, rue aka Hege, bú onozi eze, onye nēdebe ndinyom; ka enye kwa ha ihe-nsacha nile ha:


Ewe kpọ ndi-ode-akwukwọ eze na mb͕e ahu, n'ọnwa nke-atọ, nke ahu bu ọnwa Sivan, n'ubọchi nke-orú-na-atọ nime ya; ewe de ya dika iwu nile si di nke Mọdekai nyere ndi-Ju, nye kwa ndi nọchiri anya eze na ndi nāchi ala na ndi-isi ala nile anāchi achi nke di site n'India we rue Etiopia, bú ọgu ala isi na asa nke anāchi achi, ala ọ bula anāchi achi dika odide-akwukwọ-ya si di, na ndi ọ bula dika asusu-ya si di, nye kwa ndi-Ju dika odide-akwukwọ-ha si di, na dika asusu-ha si di.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan