Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Esta 2:15 - Bible Nso

15 Ma mb͕e orúrú Esta, bú nwa-nwayi Abihail nwa-nne nna Mọdekai, onye kuru ya n'onwe-ya ka ọ buru nwa-ya nwayi, biaruru ibakuru eze, ọ chọghi ihe, ọ bu nání ihe Hegai, bú onozi eze, onye nēdebe ndinyom, nāsi ya. Esta we nānata amara n'anya ndi nile nāhu ya anya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Mgbe oge Esta (ada Abihail, onye bụ nwanne nna Mọdekai, onye kpọọrọ nwantakịrị nwaagbọghọ a ka ọ bụrụ nwa nke ya) ga-eji gaa nʼihu eze ruru, ọ nabatara ndụmọdụ Hegai, onozi ahụ na-elekọta ndị inyom. Ọ hụtara amara nʼihu mmadụ niile ndị hụrụ ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Esta 2:15
10 Iomraidhean Croise  

N'anyasi ka nwayi ahu batara, n'ututu ka nwayi ahu laghachi-kwa-ra n'ulo nke-abua nke ndinyom, rue aka Shaashgaz, bú onozi eze, onye nēdebe ndi-iko-nwayi: ọ dighi-abiakute eze ọzọ, ma-ọbughi na ihe-ya tọrọ eze utọ, ewe kpọ ya n'aha.


Ewe kuru Esta jekuru eze, bú Ahasuerọs, rue ulo ala-eze ya, n'ọnwa nke-iri, nke ahu bu ọnwa Tebet, n'arọ nke-asa nke ọbubu-eze-ya.


ka eze me kwa ndi-nlekọta n'ala nile anāchi achi nke ala-eze-ya, ka ha we chikọta umu-ab͕ọghọ nile ndi nāmaghi nwoke, bú ndi di nma ile anya, rue Shushan, bú ulo uku eze, rue ulo ndinyom, rue aka Hege, bú onozi eze, onye nēdebe ndinyom; ka enye kwa ha ihe-nsacha nile ha:


N'ubọchi ahu eze, bú Ahasuerọs, nyere Esta, bú nwunye eze, ulo Heman, bú onye nākpab͕u ndi-Ju. Ma Mọdekai biara n'iru eze; n'ihi na Esta gosiri ka ya na ya si di.


Esta, bú nwunye eze, nwa-nwayi Abihail, na Mọdekai, bú onye-Ju, we were ike nile de akwukwọ ime ka akwukwọ-ozi a nke-abua nke Purim guzosie ike.


Egwù Jehova bu idọ-aka-na-nti nke amam-ihe; Ọ bu kwa n'iru nsọpuru ka obi ume-ala nāga.


Nání otù ka ọ bu, bú ndurum, onye nkem nke zuru okè; Nání otù nwa nne-ya muru ka ọ bu; Onye arọputara arọputa nke nwanyi muru ya nwere ka ọ bu. Umu-ndinyom huru ya, we si na ọ bu onye ihe nāgara nke-ọma; E, ọgu eze-nwanyi atọ ahu na ọgu ndinyom anọ ahu, bú iko, ha we to ya.


Mu onwem bu mb͕idi, aram abua di kwa ka ulo-elu-ya: Mb͕e ahu adim n'anya-ya dika onye nāchọta udo.


weputa kwa ya na nkpab͕u-ya nile, nye kwa ya amara na amam-ihe n'iru Fero eze Ijipt; o we me ya onye-isi Ijipt na ulo-ya dum.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan