Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Esta 10:2 - Bible Nso

2 Ma ọlu nile nke ike-ya na nke idi-ike-ya, na ọkukọ-isi nke idi-uku nke Mọdekai, bú nke eze mere ya ka ọ di uku, èdeghi ihe ndia n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Midia na Peasia?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Ma ọrụ ukwu na ọrụ niile ọ rụrụ, ya na ihe niile gbasara ịdị ukwuu nke Mọdekai, na ugwu niile eze nyere ya, ha niile ka e dere nʼime akwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Midia na Peshịa mere nʼoge ọchịchị ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Esta 10:2
10 Iomraidhean Croise  

Ma okwu Solomon nile nke fọduru, na ihe nile O mere, na amam-ihe-ya, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ okwu Solomon?


Ma ihe nile nke fọduru nke Jeroboam mere, ka o si bu agha, na ka o si buru eze, le, edewo ha n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel.


Ma okwu Ehab nile nke fọduru, na ihe nile ọ mere, na ulo ọdu nke o wuru, na obodo nile nke o wuru, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel?


Ewe jua ase okwu ahu, chọputa ya, ewe kwuba ha abua n'osisi: ewe de ya n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi ahu n'iru eze.


N'abali ahu urá eze fepuru n'anya-ya; o we si ka ewebata akwukwọ ihe-ncheta nke ihe emere n'ubọchi ahu, ewe nāgu ha n'iru eze.


Mọdekai we si n'iru eze pua n'uwe ala-eze nke ákwà anunu na ezi ákwà ọcha, ya na okpu-eze ọla-edo di uku, na uwe-nwuda nke ezi ákwà ọcha na ákwà ododo: obodo Shushan we tie nkpu ṅuri kwa ọṅu.


Eze we wezuga nb͕a-aka-ya, nke o mere ka ọ ghara idi n'aka Heman, o we nye ya Mọdekai. Esta we do Mọdekai onye-isi ulo Heman.


N'ihi na Mọdekai di uku n'ulo eze, akukọ-ya we nējezu n'ala nile anāchi achi: n'ihi na nwoke ahu, bú Mọdekai, nāga n'iru n'idi uku.


I nyewokwam ọta nzọputa-Gi: Aka-nri-Gi nākwagidekwam, Ume-ala-n'obi nke Gi nēmekwam ka m'ba uba.


Mb͕e ahu eze mere ka Daniel di uku, ọ di kwa ọtutu onyinye di uku ka o nyere ya, o me-kwa-ra ya ka ọ buru onye nāchi ala ahu nile anāchi achi, bú Babilon, na onye-isi ndi nọchiri anya eze n'ichi ndi-amam-ihe nile nke Babilon.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan