Esta 1:19 - Bible Nso19 Ọ buru na ọ di eze nma, ka okwu ala-eze si n'iru ya pua, ka ede kwa ya n'akwukwọ n'etiti iwu Peasia na Media, o we ghara igabiga, ka Vashti ghara ibia ọzọ n'iru eze, bú Ahasuerọs; ka eze nye kwa nwayi-ibe-ya nke ka ya nma ọnọdu-nwunye-eze-ya. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a19 “Ya mere, ọ bụrụ na ọ masị eze, ya nye iwu, nke a ga-edepụta, ka ọ bụrụ iwu nʼala Peshịa na Midia, nke na-agaghị agbanwe, na Vashti agaghị abatakwa nʼihu eze Sekses ọzọ. Ka eze werekwa ọnọdụ eze nwanyị ahụ nye onye ọzọ ka ya mma. Faic an caibideil |
si, Ọ buru na ọ di eze nma, ọ buru kwa na ahutawom amara n'iru ya, ọ buru kwa na okwu a ziri ezi n'iru eze, ọ buru kwa na mu onwem adi nma n'anya-ya, ka ede ya n'akwukwọ iweghachi akwukwọ, bú èchìchè Heman nwa Hamedata onye Egag, nke o dere ime ka ndi-Ju la n'iyì, bú ndi nọ n'ala nile anāchi achi nke eze.