Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Esta 1:13 - Bible Nso

13 Eze we si ndi mara ihe, bú ndi mara mb͕e di iche iche, (n'ihi na otú a ka okwu eze di n'iru ndi nile mara iwu na ikpé;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Dịka eze Sekses na-eme, ọ kpọkwara ndị ọkachamara nʼihe gbasara iwu na ikpe ziri ezi. Eze na ndị a mara ihe, bụ ndị maara ihe ụbọchị nyere kparịtara ụka.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Esta 1:13
11 Iomraidhean Croise  

Site kwa n'umu Isaka, bú ndi mara nghọta bayere mb͕e ahu nile, imara ihe Israel gēme; ndi-isi-ha bu ọgu iri; umu-nne-ha nile nēme kwa dika okwu-ọnu-ha si di.


Site na Zebulun, ndi nāpukuru usu-ndi-agha, ndi nēdo agha n'usoro, ndi chiri ihe-agha nile, orú nnù uzọ isi na nnù ise; ndi nēdo onwe-ha n'usoro, nēnweghi obi abua.


Nwunye eze, bú Vashti, we ju ibia n'okwu eze nke sitere n'aka ndi-onozi: eze we we iwe nke-uku, ọnuma-ya nēre ọku nime ya.


Ònye nāgaghi-atu egwu Gi, Eze mba nile? n'ihi na Gi ka o kwesiri: n'ihi na n'etiti ndi-amam-ihe nile nke mba nile, na n'ala-eze nile ha, ọ dighi onye di ka Gi ma-ọli.


N'ihi nka eze were iwe, iwe-ya we di ọku nke-uku, o we si ka eme ka ndi-amam-ihe nile nke Babilon la n'iyi.


Eze we si ka akpọ ndi-ode-akwukwọ di nsọ na ndi-dibia na ndi-mb͕asi na ndi Kaldea igosi eze nrọ-ya nile. Ha we bata guzo n'iru eze.


Daniel zara n'iru eze, si ihe-nzuzo nke eze juworo, ndi mara ihe na ndi-dibia na ndi-ode-akwukwọ di nsọ na ndi nēkè elu-igwe apughi ikọrọ eze ya;


Eze kpọsiri nkpu ike, si ka eme ka ndi-dibia na ndi Kaldea na ndi nekè elu-igwe bata. Eze zara, si ndi-amam-ihe nke Babilon, Onye ọ bula nke gāgu ihe a edere, kọ-kwa-ram isi-ya, uwe-ododo ka o gēyi, iyab͕a ọla-edo gādi kwa n'olu-ya, ọ bu kwa dika otù nime ndi-eze atọ n'ala-eze a ka ọ gāchi achi.


N'ututu unu nāsi kwa, Iru elu-igwe gājọ njọ ta: n'ihi na elu-igwe nācha uhie uhie, b͕aru kwa. Unu mara itule iru elu-igwe, ma unu apughi itule ihe-iriba-ama nke oge ndia.


Ma mb͕e amuru Jisus na Betlehem nke Judia n'ubọchi Herod, bú eze, le, ufọdu ndi mara ihe, ndi sitere n'Ọwuwa-anyanwu, biaruru Jerusalem,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan