Esta 1:1 - Bible Nso1 O rue, n'ubọchi Ahasuerọs, (nka bu Ahasuerọs nke bu eze ọgu ala anāchi achi na asa, site n'India we rue Etiopia:) Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a1 Nke a bụ ihe mere nʼoge ọchịchị eze Sekses, bụ Sekses nke chiri alaeze nwere mpaghara dị iche iche nke karịrị otu narị na iri abụọ na asaa (127), nke gbasakwara site nʼIndia rụọ Kush. Faic an caibideil |
Ewe kpọ ndi-ode-akwukwọ eze na mb͕e ahu, n'ọnwa nke-atọ, nke ahu bu ọnwa Sivan, n'ubọchi nke-orú-na-atọ nime ya; ewe de ya dika iwu nile si di nke Mọdekai nyere ndi-Ju, nye kwa ndi nọchiri anya eze na ndi nāchi ala na ndi-isi ala nile anāchi achi nke di site n'India we rue Etiopia, bú ọgu ala isi na asa nke anāchi achi, ala ọ bula anāchi achi dika odide-akwukwọ-ya si di, na ndi ọ bula dika asusu-ya si di, nye kwa ndi-Ju dika odide-akwukwọ-ha si di, na dika asusu-ha si di.