Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Emọs 9:7 - Bible Nso

7 Ọ̀ bughi ndi di ka umu ndi Etiopia ka unu burum, unu umu Israel? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. Ọ̀ bughi Israel ka M'meworo ka ha si n'ala Ijipt rigoputa, na ndi Filistia site na Kaftoa, na ndi Siria site na Kia?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 “Ọ bụ na unu ndị Izrel adịghị ka ndị Kush nʼebe m nọ?” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ọ bụ na-esighị m nʼala Ijipt kpọpụta Izrel, site na Kafto kpọpụta ndị Filistia, ma kpọpụtakwa ndị Aram site na Kia?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Emọs 9:7
14 Iomraidhean Croise  

Eze Asiria we ge ya nti: eze Asiria we rigorue Damaskọs, were ya, me ka ndi-ya je biri na Kia, o me-kwa-ra ka Rezin nwua.


Jehova we tib͕ue ndi Etiopia n'iru Esa, na n'iru Juda; ndi Etiopia we b͕alaga.


Zera, bú onye Etiopia, we chiri usu-ndi-agha, bú orú nnù ndikom ọgu uzọ isi na uzọ ise, na ọgu ub͕ọ-ala iri-na-ise, pukute ha; o we biarue Marisha.


O rue, n'otù ubọchi ahu, na Jehova mere ka umu Israel si n'ala Ijipt puta n'usu nile nke ndi-agha-ha.


otú a ka eze Asiria gēdulaga ndi Ijipt adọtara n'agha, na ndi Etiopia emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ma umu ntà ma ndi-okenye, b͕ara ọtọ na ukwu efu, b͕a kwa ọtọ n'otule, ib͕aba Ijipt ọtọ.


Ilam bu-kwa-ra àkpà-àkú, ya na usu madu, bú ndi-inyinya; Kia kpughepu-kwa-ra ọta.


N'ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-gi, na Onye Nsọ nke Israel, na onye-nzọputa-gi; enyewom Ijipt ka ọ buru ihe-nb͕aputa-gi, enyewom Etiopia na Seba n'ọnọdu gi.


Onye Etiopia, ọ̀ gāb͕anwe akpukpọ-aru-ya? ma-ọbu agu, ọ̀ gāb͕anwe agwa-ya? ọ buru otú a unu onwe-unu puru kwa ime ezi ihe, bú ndi emere ka unu muta ime ihe ọjọ.


n'ihi ubọchi ahu nke nābia ipunara ndi Filistia nile ihe-ha, ibipu na Taia na ibipu na Zaidon onye-iye-aka ọ bula nke fọduru: n'ihi na Jehova nāpunara ndi Filistia ihe, bú ndi agwe-etiti Kaftoa fọduru.


Ọ bu kwa onye-amuma ka Jehova jiri me ka Israel si n'Ijipt rigoputa, ọ bu kwa onye-amuma ka ejiri debe ya.


M'gētiji kwa nkpọrọ Damaskọs, si na ndagwurugwu Even bipu onye bi ya, si kwa n'ulo Eden bipu onye nējide nkpa-n'aka-eze: agēme kwa ka ndi Siria je biri n'ala ọzọ, bú Kia; otú a ka Jehova siri.


Ọ bu kwa Mu onwem mere ka unu si n'ala Ijipt rigoputa, M'me-kwa-ra ka unu je ije n'ọzara ọgu arọ abua, ka unu we nweta ala ndi-Amorait.


ma Avim ndi bi n'obodo ntà rue Geza, Kaftorim, ndi si na Kaftoa puta, kpochapuru ha, bichie n'ọnọdu ha.)


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan