Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Emọs 9:3 - Bible Nso

3 Ọ buru kwa na ha ezobe onwe-ha n'elu Kamel, n'ebe ahu ka M'gāchọputa ha were ha; ọ buru kwa na ezonari ha anyam abua n'ala oké osimiri, site n'ebe ahu ka M'gēnye agwọ ahu iwu, o we ta ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Ọ bụrụkwa na ha ezoo onwe ha nʼelu Kamel nʼebe ahụ ka m ga-esi chọpụta ha, kpụrụ ha, a sịkwa na ha ezoo onwe ha nʼala oke osimiri, nʼebe ahụ ka m ga-enye ajụala nke mmiri iwu ka ọ taa ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Emọs 9:3
10 Iomraidhean Croise  

Ha we nu olu Jehova, bú Chineke, ka Ọ nējeghari n'ubi ahu ab͕ara ogige mb͕e ifufe nēfe n'ubọchi: madu ahu na nwunye-ya we zopu onwe-ha n'iru Jehova, bú Chineke, n'etiti osisi nke ubi ahu ab͕ara ogige.


Ndi ala ọzọ nāta aru, Ke onwe-ha ihe-ọkiké, si n'ebe-nmechibido-ha puta.


I we si, Gini ka Chineke mara? Ò gēsi n'azu oké ochichiri kpe ikpe?


Ọ dighi ọchichiri di, ọ dighi kwa onyinyo ọnwu di, Ebe ndi nālu ajọ ihe gēzo onwe-ha.


Ka I we b͕aye ukwu-gi n'ọbara, Ka ire nkita-gi nile we si n'aru ndi-iro-gi kère òkè-ya.


N'ubọchi ahu Jehova gēwere mma-agha-Ya di arọ́ di uku di ike ji nmehie-ha leta leviathan, bú agwọ nāb͕a ọsọ, na leviathan, bú agwọ b͕agọrọ ab͕agọ; Ọ gēb͕u kwa ogologo anu ahu nke di n'oké osimiri.


Le, M'gaje iziga kpọ ọtutu ndi-ọ́kù, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ha gākùru ha; emesia M'gēziga kpọ ọtutu ndi-ntá, gēsi n'elu ugwu ọ bula, na n'elu ugwu ntà ọ bula, na nime nb͕awa nkume nile di elu, chu ntá ha.


Ọ we si, Jehova gēsi na Zaion bib͕ọ, me ka olu-Ya si na Jerusalem da; ebe-ita-nri nile nke ndi-ọzùzù-aturu ewe ru újú, elu Kamel gākpọnwu kwa.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan