Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Emọs 8:8 - Bible Nso

8 Ala, ọ̀ gaghi-ama jijiji n'ihi nka? onye ọ bula nke bi nime ya, ọ̀ gaghi-eru kwa újú? e, ọ gērujucha dika osimiri Nail; ọ gāmaghari amaghari kwa, tacha, dika osimiri Nail nke Ijipt.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Ọ bụ na ala agaghị ama jijiji nʼihi nke a, ndị niile bi nʼime ya ha agaghị eru ụjụ? Ala a niile ga-etoju dịka osimiri Naịl, a ga-eme ka ọ magharịa malie elu, ma tachaa dịka iyi Ijipt.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Emọs 8:8
22 Iomraidhean Croise  

Ala we me nkpatu ma kwa jijiji, Ntọ-ala nile nke ugwu nile nāma kwa jijiji, Ewe me ka ha me nkpatu, n'ihi na iwe-Ya di ọku.


N'ihi nka ka iwe Jehova di ọku n'aru ndi-Ya, O we setipu aka-Ya megide ha, tib͕ue ha, ugwu nile we ma jijiji, ozu ndi ahu we di ka ǹsí-anu n'etiti èzí nile. N'ihe a nile iwe-Ya alaghachighi azu, kama rue ub͕u a ka aka-Ya nēseti eseti.


Rùe ole mb͕e ka ala gēru újú? rùe ole mb͕e ka ihe-ọkukú nke ubi nile gākpọnwu? site n'ihe ọjọ nke ndi bi nime ya ekpochapuwo anu-ulo nile na anu-ufe; n'ihi na ha siri, Ọ gaghi-ahu ikpe-azu-ayi.


Ònye bu onye a? dika osimiri Nail ka ọ nērú, dika osimiri ka miri-ya nile nāmaghari.


Ijipt nērú dika osimiri Nail, ọ bu kwa dika osimiri ka miri-ya n'amaghari: o we si, M'gārigo, kpuchie uwa; m'gēme ka obodo na ndi bi nime ya la n'iyì.


Ala ahu we nāma jijiji, nāb͕ali kwa: n'ihi na èchìchè nile nke Jehova megide Babilon eguzosiwo ike, ime ka ala Babilon ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ghara inwe onye-obibi.


Ma mb͕e ọgu ízù atọ na abua ahu gasiri agēbipu onye etere manu, ọ dighi kwa ihe ọ gēnwe: ọ bu kwa obodo ahu na ebe nsọ ahu ka ndi nke otù onye-ndú nke gaje ibia gēbibi; ma ọgwugwu-ya gādi na nrubiga-ókè dika nke miri, ọ bu kwa rue ọgwugwu mb͕e ahu ka agha gādi; ihe akara àkà bu itọb͕ọrọ-n'efu di iche iche.


Ọ bu bayere umu-ehi nke Bet-even ka ndi bi na Sameria gātu ujọ: n'ihi na ndi-ya gēruru ya újú, ha na ndi-nchu-àjà-ya ndi nētere ya-ri egwú ọṅù, n'ihi nsọpuru-ya, n'ihi na o siwo n'ebe ọ nọ je biri n'ala ọzọ.


N'ihi nka ka ala nka gēru újú, onye ọ bula nke bi nime ya gāta kwa aru, ya na anu ọhia na anu-ufe nke elu-igwe; ọ bu kwa azù nile nke oké osimiri ka agēkpochapu.


M'gāb͕anwe kwa ememe nile unu ka ha ghọ iru-újú, na abù nile unu, ka ha ghọ abù-ákwá; M'gēme kwa ka ákwà-nkpe biakwasi n'úkwù nile, na isi-nkwọcha n'isi nile ọ bula; M'gēme kwa ya ka ọ di ka újú anēruru nwa-nwoke amuru nání ya, M'gēme kwa ka mb͕e ikpe-azu ya di ka ubọchi nēlu ilu.


Ọ bu kwa Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bu Onye nēmetu ala, o we b͕aze, ndi nile ndi bi nime ya ewe rue újú; ọ gērujucha kwa dika osimiri Nail, we tacha, dika osimiri Nail nke Ijipt;


Ma Ọ gēji miri nke nērubiga ókè nke nērubiga erubiga me ka ọnọdu obodo ahu gwusia, ọ bu kwa ndi-iro-Ya ka Ọ gāchubà n'ọchichiri.


mb͕e ahu ka ihe-iriba-ama nke Nwa nke madu gāputa kwa ìhè n'elu-igwe: mb͕e ahu ka ebo nile nke uwa gēti kwa aka n'obi, ha gāhu kwa Nwa nke madu ka Ọ nābia n'elu igwe-oji nile nke elu-igwe n'ike na oké ebube.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan