Emọs 7:9 - Bible Nso9 ebe nile di elu nke Aisak gātọb͕ọ kwa n'efu, ebe nsọ nile nke Israel gāghọ kwa nkpọnkpọ ebe; M'gēji kwa mma-agha bilie imegide ulo Jeroboam. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a9 “Ebe niile e wuliri elu nke Aịzik aghaghị ịbụ ebe e mebiri emebi, ebe nsọ niile nke Izrel aghaghị ịbụ ebe tọgbọrọ nʼefu, aghakwaghị m iweli mma agha m elu iji megide ụlọ Jeroboam.” Faic an caibideil |
Ahurum Onye-nwe-ayi, ka Ọ nēguzo Onwe-ya n'akuku ebe-ichu-àjà-Ya: O we si, Tie isi-ogidi nile, ka nbata-uzọ nile we me nkpatu: tijisie ha n'isi ha nile; ma ndi-ikpe-azu nime ha ka M'gēji mma-agha b͕ue: onye-ha nke nāb͕alaga ab͕alaga agaghi-ab͕alaga; ọzọ, onye-ha nke nāb͕apu ab͕apu agaghi-ewepuga onwe-ya.